OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Na-aṅụrịnụ Ọṅụ n’Olileanya Ahụ
Olileanya dị ka arịlịka. (Hib. 6:19) Ọ na-enyere anyị aka ka okwukwe anyị ghara ikpu ka ụgbọ ma nsogbu bịara anyị. (1 Tim. 1:18, 19) Nsogbu ndị ahụ nwere ike ịbụ na ihe ndị anyị tụrụ anya ha emeghị, na ihe anyị nwere funahụrụ anyị, na anyị na-arịa ọrịa na-ekweghị ala ala, na mmadụ nwụnahụrụ anyị ma ọ bụkwanụ na ihe ọzọ nwere ike ịkpa okwukwe anyị aka ọjọọ mere anyị.
Okwukwe na olileanya na-eme ka anyị lekwasị anya n’ụgwọ ọrụ e kwere anyị ná nkwa. (2 Kọr. 4:16-18; Hib. 11:13, 26, 27) N’ihi ya, ma ànyị nwere olileanya ịga eluigwe ma ọ bụ ibi n’ụwa, anyị kwesịrị ịna-atụgharị uche ná nkwa ndị ahụ e dere na Baịbụl ka olileanya anyị nwee ike sikwuo ike. Ọ bụruzie na nsogbu abịara anyị, ọ ga-adịrị anyị mfe idi ya ma nọgide na-enwe obi ụtọ.—1 Pita 1:6, 7.
LEENỤ VIDIO BỤ́ NA-AṄỤRỊNỤ ỌṄỤ N’OLILEANYA AHỤ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
-
Gịnị mere Mozis ji bụrụ onye e kwesịrị iṅomi?
-
Olee ọrụ dịịrị ndị isi ezinụlọ?
-
Olee ihe ụfọdụ unu nwere ike iji mee Ofufe Ezinụlọ?
-
Olee otú olileanya ga-esi nyere gị aka inwe obi ike ma ọnwụnwa bịara gị?
-
Olee ihe ị na-atụ anya ya n’Alaeze Chineke?