Eluigwe Ọhụrụ na Ụwa Ọhụrụ Ga-eme Ka E Nwee Oké Ọṅụ
Nkwa Jehova kwere n’Aịzaya isi 65 ga-emezurịrị. Jehova kwudịrị ya ka à ga-asị na o meela emee.
Jehova ga-eme ka e nwee eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, ebe ndị nọ na ya na-agaghị echeta ihe mbụ niile
Gịnị bụ eluigwe ọhụrụ?
-
Ọ bụ ọchịchị ọhụrụ ga-eme ka ezi omume dịrị n’ụwa
-
E hiwere ya n’afọ 1914 mgbe e chiri Kraịst eze nke Alaeze Chineke
Gịnị bụ ụwa ọhụrụ?
-
Ọ bụ ụmụ mmadụ ndị si ná mba dị iche iche, asụsụ dị iche iche nakwa agbụrụ dị iche iche. Ha ji obi ha niile na-erubere ọchịchị Chineke isi
Olee otú o si bụrụ na ihe mbụ niile agaghị abatakwa n’obi?
-
Ihe ndị ahụ na-akpatara ndị mmadụ obi ọjọọ, ya bụ, ahụhụ, nchekasị, na obi mgbawa agaghị adịkwa ọzọ
-
Ụmụ mmadụ ndị na-erubere Chineke isi ga-anụ ụtọ ndụ. Ụbọchị ọ bụla ga na-emekwa ha obi ụtọ