Ebe ụmụnna anyị na-akụzi eziokwu Baịbụl na Kambodia

USORO IHE OMUME OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ Febụwarị 2018

Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta

Mkparịta ụka ndị a ga-eji zaa mmadụ ajụjụ ndị dị ka: Baịbụl ọ̀ ka bara uru taa? Ihe Baịbụl kwuru ọ̀ dabara n’ihe ndị sayensị chọpụtara? Ihe ndị Baịbụl kwuru ọ̀ na-abara anyị uru?

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Ihe Atụ nke Ọka Wit na Ata

Olee ihe Jizọs ji ihe atụ nke ọka wit na ata na-akọwa? Ònye ka ọgha mkpụrụ, onye iro, na ndị na-ewe ihe ubi nọchiri anya ya?

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ihe Atụ Ndị E Mere Gbasara Alaeze Chineke na Ihe Ndị Ha Pụtara

Jizọs ji ihe atụ ndị dị mfe kụziere ndị mmadụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ n’okwu Chineke. Olee ihe ndị anyị na-amụta na Matiu isi 13?

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Jizọs Si n’Aka Mmadụ Ole na Ole Nye Ọtụtụ Ndị Nri

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha nye ọtụtụ puku mmadụ nri, n’agbanyeghị na ihe ha nwere bụ naanị ogbe achịcha ise na azụ̀ abụọ. Gịnị mechara mee, oleekwa ihe anyị na-amụta na ya?

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

“Sọpụrụ Nna Gị na Nne Gị”

Jizọs kwusiri okwu ike gbasara iwu bụ́ “Sọpụrụ nna gị na nne gị.” Ò nwere mgbe anyị kwesịrị ịkwụsị irubere ndị mụrụ anyị isi?

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Ònye Ka Ị Na-eche Echiche Ka Ya?

Olee ihe anyị kwesịrị ime ma anyị chọọ ka uche Chineke na-eduzi anyị, ọ bụghị nke Setan? Jizọs kwuru ihe atọ anyị kwesịrị ime iji kwe ka uche Chineke na-eduzi anyị.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma​—⁠Ịjụ Ajụjụ Ndị Dabara Adaba

Jizọs jụrụ ndị na-ege ya ntị ọtụtụ ajụjụ iji kụziere ihe dị iche iche. Olee otú anyị nwere ike isi mụta ịjụ ajụjụ ka Jizọs?

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Kpachara Anya Ka Ị Ghara Ime Ka Gị na Ndị Ọzọ Sụọ Ngọngọ

Jizọs ji ihe atụ ụfọdụ kụziere anyị na ọ dị njọ mmadụ ịsụ ngọngọ ma ọ bụ ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ. Olee ihe ndị nwere ike ịghọrọ m ihe ịsụ ngọngọ?