Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MATIU 14-15

Jizọs Si n’Aka Mmadụ Ole na Ole Nye Ọtụtụ Ndị Nri

Jizọs Si n’Aka Mmadụ Ole na Ole Nye Ọtụtụ Ndị Nri

Obere oge tupu Ememme Ngabiga nke afọ 32 amalite, Jizọs rụrụ otu ọrụ ebube. Matiu, Mak, Luk na Jọn dechara gbasara ya. O nweghị ọrụ ebube ọzọ ha anọ dechara gbasara ya.

Jizọs ji ọrụ ebube a bido otu ihe ọ ka na-eme ruo taa.

14:16-21

  • Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha nye ìgwè mmadụ nri, n’agbanyeghị na ihe ha nwere bụ naanị ogbe achịcha ise na azụ̀ abụọ

  • Jizọs weere ogbe achịcha na azụ̀ ndị ahụ, kpee ekpere, nyawaa ha nye ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya ekesaziere ya ìgwè mmadụ ahụ

  • Jizọs rụrụ ọrụ ebube nyejuo mmadụ niile afọ, nri amafọkwa. O si n’aka mmadụ ole na ole, ya bụ, ndị na-eso ụzọ ya, nye ọtụtụ puku mmadụ nri

  • Jizọs buru amụma na ya ga-ahọpụta ndị ọ ga-esi n’aka ha na-enye ndị mmadụ ‘nri n’oge kwesịrị ekwesị’ n’oge ikpeazụ.—Mat. 24:45

  • N’afọ 1919, Jizọs họpụtara “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” bụ́ ụmụnna nwoke ole na ole e tere mmanụ ka ha na-elekọta “ezinụlọ ya”

  • Jizọs si n’aka ụmụnna ole na ole a e tere mmanụ na-eme ihe ahụ o bidoro n’oge ndịozi

Olee otú m ga-esi gosi na m ma ndị Jizọs si n’aka ha na-akụziri ndị mmadụ ihe taa, oleekwa otú m nwere ike isi na-akwanyere ha ùgwù?