Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

“Sọpụrụ Nna Gị na Nne Gị”

“Sọpụrụ Nna Gị na Nne Gị”

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o kwusiri okwu ike gbasara iwu bụ́: “Sọpụrụ nna gị na nne gị.” (Ọpụ. 20:12; Mat. 15:4) Jizọs gwara ndị mmadụ ihe a n’ihi na yanwa “nọkwa na-edo onwe ya n’okpuru” ndị mụrụ ya mgbe ọ bụ nwata. (Luk 2:51) Mgbe ọ ghọrọ dimkpa, ọ gbara mbọ hụ na a ga na-elekọta mama ya nke ọma ma ọ nwụọ.—Jọn 19:26, 27.

Taa, ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst na-erubere ndị mụrụ ha isi ma na-ejikwa nkwanye ùgwù agwa ha okwu. N’eziokwu, o nweghị mgbe anyị kwesịrị ịkwụsị ịna-erubere ndị mụrụ anyị isi. Ọ bụrụgodị na ha emeela agadi, anyị ka kwesịrị ịna-anabata ndụmọdụ ha, si otú ahụ na-asọpụrụ ha. (Ilu 23:22) Anyị na-asọpụkwara ha ma anyị na-elekọta ha ma na-egboro ha mkpa ha. (1 Tim. 5:8) Ma ànyị bụ ụmụaka ma ànyị bụ dimkpa, anyị na ndị mụrụ anyị ịna-akparịta ụka bụ otu ụzọ kachanụ anyị si asọpụrụ ha.

LEENỤ KATUUN A NA-ESE NA BỌỌDỤ BỤ́ OLEE OTÚ M GA-ESI AKỌRỌ NDỊ MỤRỤ M OBI M? ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Gịnị nwere ike ime ka o siere gị ike ịgwa ndị mụrụ gị okwu?

  • Olee otú ị ga-esi na-akwanyere ndị mụrụ gị ùgwù ma ị gwawa ha okwu?

  • Olee ihe mere o ji dị oké mkpa ka gị na ndị mụrụ gị na-ekwurịta okwu? (Ilu 15:22)

    Ịgwa ndị mụrụ gị okwu nwere ike ime ka ihe gaziere gị ná ndụ