Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma​—⁠Ịjụ Ajụjụ Ndị Dabara Adaba

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma​—⁠Ịjụ Ajụjụ Ndị Dabara Adaba

IHE MERE O JI DỊ MKPA: Ọ bụrụ na “echiche nke dị n’obi mmadụ yiri mmiri miri emi,” ajụjụ dị ka bọket a ga-eji esepụta ya. (Ilu 20:5) Ajụjụ na-enyere anyị aka ime ka mmadụ tinye ọnụ n’ihe a na-ekwu. Ihe ha zara na-emekwa ka anyị mata echiche ha. Jizọs jụrụ ndị na-ege ya ntị ajụjụ ndị dabara adaba. Olee otú anyị ga-esi eme ka ya?

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Jụọ ajụjụ ndị ga-eme ka mmadụ kwuo obi ya. Jizọs jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ ndị nyeere ya aka ịmata echiche ha. (Mat. 16:13-16; be 238 ¶2-4) Olee ajụjụ ndị i nwere ike ịjụ mmadụ ka o kwuo ihe dị ya n’obi?

  • Jụọ ajụjụ ndị ga-eme ka mmadụ mata nke bụ́ eziokwu. Iji gbazie echiche Pita, Jizọs jụrụ ya ajụjụ ndị mere ka ọ mata ihe o kwesịrị ime. (Mat. 17:24-26) Olee ajụjụ ndị i nwere ike ịjụ mmadụ ga-enyere ya aka ịmata nke bụ́ eziokwu?

  • Jaa onye ahụ mma maka azịza ya. Mgbe otu onye odeakwụkwọ zara ajụjụ a jụrụ ya “dị ka onye maara ihe,” Jizọs jara ya mma. (Mak 12:34) Olee otú ị ga-esi jaa mmadụ mma ma ọ zaa ajụjụ?

LEENỤ AKỤKỤ NKE MBỤ NKE VIDIO BỤ́ NA-ARỤ ỤDỊ ỌRỤ JIZỌS RỤRỤ—NA-AKỤZI IHE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Gịnị mere na otú nwanna a si kụzie ihe adịghị mma n’agbanyeghị na ihe ndị o kwuru bụ eziokwu?

  • Gịnị mere nkụzi ihe anyị ekwesịghị ịbụ naanị nkọwa nkọwa?

LEZIENỤ AKỤKỤ NKE ABỤỌ NKE VIDIO AHỤ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee otú nwanna ahụ si jụọ onye ọ na-amụrụ ihe ajụjụ ndị dabara adaba?

  • Olee ihe ndị ọzọ anyị mụtara n’otú nwanna a si kụzie ihe?

Ihe anyị na-akụziri ndị mmadụ ọ̀ na-edo ha anya ka ọ̀ na-agba ha gharịị? (Luk 24:32)