Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Febụwarị 26–​Mach 4

MATIU 18-19

Febụwarị 26–​Mach 4
  • Abụ nke 121 na Ekpere

  • Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

  • Kpachara Anya Ka Ị Ghara Ime Ka Gị na Ndị Ọzọ Sụọ Ngọngọ”: (Nkeji 10)

    • Mat. 18:6, 7—Anyị ekwesịghị ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ (nwtsty ihe ndị e ji kọwaa amaokwu ndị ahụ)

    • Mat. 18:8, 9—Anyị kwesịrị ịgbara ihe ọ bụla ga-eme ka anyị sụọ ngọngọ ọsọ (nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara n’amaokwu ndị ahụ na Nkọwa Okwu Ndị Dị na Baịbụl, “Gehena”)

    • Mat. 18:10—Jehova maara ma ànyị emeela ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ (nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara n’amaokwu ahụ; w10 11/1 16)

  • Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)

    • Mat. 18:21, 22—Ugboro ole ka anyị kwesịrị ịdị njikere ịgbaghara ụmụnna anyị mmejọ? (nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara n’amaokwu ndị ahụ)

    • Mat. 19:7—Olee ihe mere e ji enye nwaanyị “akwụkwọ nchụpụ”? (nwtsty ihe ndị e ji kọwaa amaokwu ahụ)

    • Gịnị ka ọgụgụ Baịbụl nke izu a kụziiri gị gbasara Jehova?

    • Olee ihe ndị ọzọ ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a?

  • Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Mat. 18:18-35

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

  • Nletaghachi nke Abụọ: (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Jiri ihe dị n’ebe e dere “Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta” mee ya.

  • Nletaghachi nke Atọ: (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Họrọ amaokwu Baịbụl ị chọrọ. Nye ya akwụkwọ e ji amụ Baịbụl.

  • Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 6 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) bhs 26 ¶18-20—Gosi otú anyị ga-esi ruo onye anyị na-amụrụ ihe n’obi.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

  • Abụ nke 90

  • Emela Ihe Ọ Bụla Ga-eme Ka Mmadụ Sụọ Ngọngọ (2 Kọr. 6:3): (Nkeji 9) Kpọnye vidio ahụ.

  • A Ga-ebido Ịkpọ Ndị Mmadụ Ka Ha Bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs na Mach 3: (Nkeji 6) Okwu. Ọ ga-esi n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị nke Febụwarị 2016 peeji nke 8. Nye onye ọ bụla bịara ọmụmụ ihe otu akwụkwọ ịkpọ òkù. Kwurịtanụ ihe e dere na ya. Mee ka o doo anya na mgbe a ga-ekwu okwu ihu ọha pụrụ iche isiokwu ya bụ “Ònye Ka Jizọs Bụ n’Eziokwu?” ga-abụ n’izu Mach 19, 2018. Ọ ga-eme ka a tụsiwe anya ike maka Ncheta Ọnwụ Jizọs. Kwuzie nhazi e mere maka ịrụzu ókèala unu.

  • Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) jy isi nke 10, na igbe dị na peeji nke 28

  • Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)

  • Abụ nke 133 na Ekpere