Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MATIU 18-19

Kpachara Anya Ka Ị Ghara Ime Ka Gị na Ndị Ọzọ Sụọ Ngọngọ

Kpachara Anya Ka Ị Ghara Ime Ka Gị na Ndị Ọzọ Sụọ Ngọngọ

Jizọs ji ihe atụ ụfọdụ kụziere anyị na ọ dị njọ mmadụ ịsụ ngọngọ ma ọ bụ ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ.

18:6, 7

  • “Ihe ịsụ ngọngọ” bụ ihe ọ bụla mere ka mmadụ kpaa àgwà na-adịghị mma, ma ọ bụkwanụ mee mmehie

  • Ọ ga-akara onye mere ka mmadụ ibe ya sụọ ngọngọ mma na ọ nya nkume igwe nri n’olu daba n’osimiri

Nkume igwe nri

18:8, 9

  • Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha gbupụ aka ha ma ọ bụ ghụpụ anya ha ma ọ bụrụ na ọ na-eme ka ha sụọ ngọngọ

  • Ọ ga-aka mma na mmadụ hapụrụ ihe ndị a dị ya mkpa ma banye n’Alaeze Chineke karịa na o jidesiri ha ike banye na Gehena, bụ́ mbibi ebighị ebi

Olee ihe ndị nwere ike ịghọrọ m ihe ịsụ ngọngọ? Oleekwa otú m ga-esi ghara ime ka mụnwa ma ọ bụ ndị ọzọ sụọ ngọngọ?