Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MATIU 12-13

Ihe Atụ nke Ọka Wit na Ata

Ihe Atụ nke Ọka Wit na Ata

Jizọs ji ihe atụ nke ọka wit na ata mee ka a mata otú ọ ga-esi esi n’etiti ụmụ mmadụ họpụta ndị niile e tere mmanụ, bụ́ ndị nọchiri anya ọka wit ahụ na mgbe ọ ga-eme ya. Ọ malitere ime ya n’afọ 33 O.N.K.

13:24

‘Otu nwoke ghara ezi mkpụrụ n’ubi ya’

  • Ọgha mkpụrụ: Jizọs Kraịst

  • A ghara ezi mkpụrụ: E ji mmụọ nsọ tee ndị na-eso ụzọ Jizọs mmanụ

  • Ubi ahụ: Ndị bi n’ụwa

13:25

“Mgbe ndị mmadụ nọ na-ehi ụra, onye iro ya bịara kụọ ata n’etiti ọka wit ahụ”

  • Onye iro: Ekwensu

  • Ndị mmadụ na-ehi ụra: Mgbe ndịozi nwụchara

13:30

“Hapụnụ ha abụọ ka ha tokọọ ruo n’oge owuwe ihe ubi”

  • Ọka wit: Ndị Kraịst e tere mmanụ

  • Ata: Ndị Kraịst adịgboroja

“Burunụ ụzọ chịkọta ata ahụ . . . ; e mesia, unu agaa chịkọta ọka wit ahụ”

  • Ndị ohu ma ọ bụ ndị na-ewe ihe ubi: Ndị mmụọ ozi

  • Ata ahụ a chịkọtara: E wepụrụ Ndị Kraịst adịgboroja ahụ n’etiti Ndị Kraịst e tere mmanụ

  • A chịbara ọka wit n’ụlọ nkwakọba ihe: A kpọbatara Ndị Kraịst e tere mmanụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst

Mgbe oge owuwe ihe ubi ahụ malitere, olee ihe ndị mere ka ezi Ndị Kraịst dị iche ná Ndị Kraịst adịgboroja?

Olee otú ịghọta ihe atụ a ga-esi baara m uru?