Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ ROM 4-6

“Chineke Mere Ka Anyị Mata Ịhụnanya Ya”

“Chineke Mere Ka Anyị Mata Ịhụnanya Ya”

5:8, 18, 21

Ihe mgbapụta ahụ Jehova nyere anyị baara ma ndị nọ n’eluigwe ma ndị nọ n’ụwa uru n’ihi na o mere ka e wepụ aha Jehova n’ụta, mee ka a mata na ọ bụ ya ka o ruuru ịchị, nakwa na ọ bụ ọchịchị ya kacha mma. Ihe ọzọ bụkwa na o mere ka anyị na Jehova dịrị ná mma ugbu a. N’ọdịnihu, ọ ga-eme ka ndị niile na-erubere ya isi nweta ndụ ebighị ebi.

Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe mgbapụta a Jehova nyere anyị?

  • Inyefe Jehova onwe anyị na ime baptizim ga-egosi na anyị nwere okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ nakwa na anyị chọrọ ịbụ nke Jehova

  • Ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke ga-egosi na anyị hụrụ ụdị mmadụ niile n’anya otú ahụ Jehova hụrụ ha.​—Mat. 22:39; Jọn 3:16

Olee ụzọ ndị ọzọ m ga-esi egosi na obi dị m ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ Jehova nyere anyị?