Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Jiri Ntachi Obi Na-echere

Jiri Ntachi Obi Na-echere

Afọ ole ka ị nọrọla na-eche ka Alaeze Chineke bịa? Ì jirila ntachi obi na-echere ya n’agbanyeghị ihe isi ike? (Rom 8:25) A na-akpọ ụfọdụ Ndị Kraịst asị, na-echi ha ọnụ n’ala, na-atụ ha mkpọrọ ma ọ bụkwanụ na-eyi ha egwu na a ga-egbu ha. Enwekwara ọtụtụ ndị nsogbu nke ha bụ ọrịa na-anaghị ala ala ma ọ bụ nká.

Gịnị ga-enyere anyị aka iji ntachi obi na-edi nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịara anyị? Anyị kwesịrị ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-atụgharị uche na ya iji mee ka okwukwe anyị sie ike. Anyị kwesịkwara ilekwasị anya n’olileanya anyị nwere. (2 Kọr. 4:​16-18; Hib. 12:2) Anyị kwesịrị ịna-arịo Jehova n’ekpere ka o jiri mmụọ nsọ ya nyere anyị aka. (Luk 11:​10, 13; Hib. 5:7) Nna anyị na-ahụ n’anya ga-enyeliri anyị aka ‘iji ọṅụ na-enwe ogologo ntachi obi.’​—Kọl. 1:11.

LEENỤ VIDIO BỤ́ KA ANYỊ JIRI “NTACHI OBI NA-AGBA ỌSỌ”​—OBI SIE GỊ IKE NA Ị GA-EMERI, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Gịnị bụ ụfọdụ “ihe a na-atụghị anya ya” nwere ike ịdapụtara mmadụ? (Ekli. 9:11)

  • Olee otú ekpere na-esi enyere anyị aka ma nsogbu bịara anyị?

  • Ọ bụrụ na anyị anaghịzi enwe ike ime ihe buru ibu n’ozi Jehova otú anyị na-emebu, gịnị mere anyị kwesịrị iji lekwasị anya n’ihe ndị anyị na-emeli ugbu a?

  • Lekwasị anya n’ụgwọ ọrụ

    Olee ihe ga-enye aka mee ka obi sie gị ike na ị ga-emerili?