Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ ROM 9-11

Ihe Atụ E Ji Osisi Oliv Mee

Ihe Atụ E Ji Osisi Oliv Mee

11:16-26

Gịnị ka ihe dị iche iche e kwuru banyere osisi oliv ahụ e ji mee ihe atụ nọchiri anya ha?

  • Osisi ahụ n’onwe ya: otú Chineke ga-esi mezuo ọgbụgba ndụ ahụ ya na Ebreham gbara

  • Ogwe osisi ahụ: Jizọs, onye bụ́ isi ná mkpụrụ Ebreham

  • Alaka ya: ndị ọzọ niile so ná mkpụrụ Ebreham

  • Alaka ndị “a nyakapụrụ” n’osisi ahụ: ndị Juu jụrụ Jizọs

  • Alaka ndị “a nyadoro” n’osisi ahụ: Ndị Kraịst e ji mmụọ nso tee mmanụ si ná mba dị iche iche

Dị ka e bụrụ n’amụma, ụmụ Ebreham, ya bụ, Jizọs na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ, ga-ewetara “mba niile nke ụwa” ọtụtụ ngọzi.​—Rom 11:12; Jen. 22:18

Olee ihe m na-amụta n’otú Jehova si mezuo nzube ya n’ihe gbasara mkpụrụ Ebreham?