OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ị̀ Na-ahụ Àgwà Ndị A Na-apughị Ịhụ Anya Chineke Nwere?
Mgbe ọ bụla ị hụrụ okoko osisi mara mma, kpakpando ndị dị ná mbara ígwé na ụda mmiri si n’ugwu na-asọda, ọ̀ naghị eme ka icheta na ha bụ ọrụ aka Chineke? Ihe ndị e kere eke dị gburugburu anyị na-eme ka anyị hụ àgwà ndị a na-apụghị ịhụ anya Jehova nwere. (Rom 1:20) Ọ bụrụ na anyị atụgharịa uche n’ihe ndị e kere eke anyị na-ahụ, anyị ga-ahụ ike Chineke, ịhụnanya ya, amamihe ya, ikpe ziri ezi ya nakwa mmesapụ aka ya.—Ọma 104:24.
Olee ihe ụfọdụ Jehova kere ị na-ahụ kwa ụbọchị? Ọ bụrụgodị na i bi n’obodo mepere emepe, ị ka nwere ike ịna-ahụ ụmụ nnụnụ na osisi dị iche iche. Ileru ihe ndị Jehova kere eke anya nwere ike inyere anyị aka ibelata nchegbu na ilekwasị anya n’ihe ndị ka mkpa. O nwekwara ike ime ka obi sie ike na Jehova ga-elekọtali anyị ruo mgbe ebighi ebi. (Mat. 6:25-32) Ọ bụrụ na i nwere ụmụaka, nyere ha aka ka ha hụ àgwà ndị magburu onwe ya Jehova nwere. Ka anyị na-amụtakwu gbasara ihe ndị Jehova kere, anyị ga-abịarukwu ya nso.—Ọma 8:3, 4.
LEENỤ VIDIO BỤ́ IHE NDỊ DỊ ỊTỤNANYA CHINEKE KERE NA-EME KA A HỤ EBUBE YA—ÌHÈ NA ỤCHA DỊ ICHE ICHE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
-
Gịnị na-enyere anyị aka ịhụ ụcha dị iche iche?
-
Gịnị mere o ji adị ka ụcha ihe ụfọdụ ọ na-agbanwe agbanwe?
-
Olee ihe mere anyi ji ahụ ụcha dị iche iche ná mbara ígwé?
-
Olee ụfọdụ ụcha ndị mara ezigbo mma ị na-ahụ n’ihe ndị e kere eke dị gburugburu ebe i bi?
-
Gịnị mere anyị kwesiri iji na-ewepụta oge eleru ihe ndị Chineke kere anya?