Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Febụwarị 12-18

ABỤ ỌMA 5-7

Febụwarị 12-18

Abụ nke 118 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Na-erubere Jehova Isi n’Agbanyeghị Ihe Ndị Ọzọ Na-eme

(Nkeji 10)

E nwere oge ụfọdụ Devid kwụsịrị inwe obi ụtọ n’ihi ihe ndị ọzọ nọ na-eme (Ọma 6:6, 7)

O kpere ekpere rịọ Jehova ka o nyere ya aka (Ọma 6:2, 9; w21.03 15 ¶7-8)

Devid nọgidere na-erubere Jehova isi maka na o ji obi ya niile tụkwasị Jehova obi (Ọma 6:10)

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘M̀ na-eme ka okwukwe m sie ezigbo ike ka m nwee ike ịna-erubere Jehova isi n’agbanyeghị ihe ndị ọzọ na-eme?’​—w20.07 8-9 ¶3-4.

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ọma 5:9​—Olee otú ọnụ ndị ajọ omume si dị ka ili ghe oghe? (it-1 995)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. (lmd isi nke 1 nọmba nke 3)

5. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 2) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Ka gị na onye ahụ na-akparịta ụka, mee ka ọ mata na ị bụ Onyeàmà Jehova n’agwaghị ya ihe ọ bụla gbasara Baịbụl. (lmd isi nke 2 nọmba nke 4)

6. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 2) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Onye nwe ụlọ chọrọ ka gị na ya rụrịtawa ụka. (lmd isi nke 4 nọmba nke 5)

7. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere

(Nkeji 4) Ihe ngosi. ijwfq 64​—Isiokwu: Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Ji Kpebie na Ha Agaghị Eso Na-eme Ememme Ndị E Ji Eto Mba? (lmd isi nke 3 nọmba nke 4)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 99

8. Akụkọ Ozi Afọ Ije Ozi Gara Aga

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ị gụchaa akwụkwọ ozi si n’aka alaka ụlọ ọrụ banyere akụkọ ozi afọ ije ozi gara aga, gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ndị ọzọ na-agba ume e kwuru n’Akụkọ Ozi Ndịàmà Jehova n’Ụwa Niile n’Afọ Ije Ozi 2023. Gbaa ndị nkwusa ụfọdụ i bu ụzọ gwa ajụjụ ọnụ. Ha ga-akọ ihe ndị na-agba ume mere n’ozi ọma ha gara n’afọ gara aga.

9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) rr isi nke 6 ¶1-6, vidio kọwara isiokwu a na-amụ

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 83 na Ekpere