Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Febụwarị 26–Mach 3

ABỤ ỌMA 11-15

Febụwarị 26–Mach 3

Abụ nke 139 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Weregodị Ya na Ị Nọ n’Ụwa Ọhụrụ Chineke nke Udo Dị na Ya

(Nkeji 10)

Ihe mere tigbuo zọgbuo ji ju ebe niile taa bụ maka na ndị mmadụ anaghị erubere iwu isi (Ọma 11:2, 3; w06 5/15 18 ¶3)

Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-eme ka tigbuo zọgbuo kwụsị n’oge na-adịghị anya (Ọma 11:5; wp16.4 11)

Iche banyere nkwa Jehova kwere na ọ ga-azọpụta ndị ya ga-enyere anyị aka iji ndidi na-echere nzọpụta anyị (Ọma 13:5, 6; w17.08 7 ¶15)

MEGODỊ IHE A: Gụọ Ezikiel 34:25, gị ewerezie ya na ị nọ n’ebe ahụ amaokwu a kwuru okwu ya nke udo dị na ya.​—kr 236 ¶16.

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ọma 14:1​—Olee otú ụdị echiche e kwuru okwu ya n’amaokwu a nwere ike isi ghọọrọ Ndị Kraịst ọnyà? (w13 9/15 19 ¶12)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 2) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Gwa onye ahụ ka ọ bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. (lmd isi nke 5 nọmba nke 3)

5. Ịmalite Mkparịta Ụka

(1 nkeji) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gwa onye ahụ ka ọ bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. (lmd isi nke 3 nọmba nke 4)

6. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Mmadụ gosiri mmasị mgbe i nyere ya akwụkwọ e ji akpọ ndị mmadụ òkù maka Ncheta Ọnwụ Jizọs. (lmd isi nke 7 nọmba nke 4)

7. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

(Nkeji 5) lff nchịkọta isi nke 13, ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ, na ihe ị ga-agba mbọ mee. Jiri otu n’ime isiokwu ndị gbara ‘n’Ihe Ị Ga-elebakwu Anya’ nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ka ọ ghọta otú Chineke si ele okpukpe ụgha anya. (th ihe ọmụmụ nke 12)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 8

8. “Amamihe Ka Ngwá Agha Mma”

(Nkeji 10) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Tigbuo zọgbuo na-akazi njọ n’ebe niile n’ụwa. Jehova ma na tigbuo zọgbuo ndị anyị na-ahụ na ihe ọjọọ ndị tigbuo zọgbuo na-eme anyị nwere ike ime ka anyị na-echegbu onwe anyị. Ọ makwa na ọ dị mkpa ka e chebe anyị. Otu n’ime ihe ndị o ji echebe anyị bụ Okwu ya, bụ́ Baịbụl.​—Ọma 12:5-7.

Ọ bụ na Baịbụl ka anyị ga-enweta amamihe nke “ka ngwá agha mma.” (Ekli. 9:18) Ka anyị leba anya n’otú ihe ndị a Baịbụl kwuru nwere ike isi nyere anyị aka ka ndị tigbuo zọgbuo ghara ịkpara anyị aka.

  • Ekli. 4:9, 10​—Anọla naanị gị n’ebe ndị ọjọọ na-anọ ma ọ bụ ebe ha nwere ike ịbịa

  • Ilu 22:3​—Mgbe ọ bụla ị nọ n’ebe ọtụtụ ndị nọ, na-eleru anya ka ị mara ihe na-eme gburugburu gị

  • Ilu 26:17​—Etinyela ọnụ n’esemokwu na-agbasaghị gị

  • Ilu 17:14​—Ị chọpụta na e nwere ndị chọrọ ibido ịlụ ọgụ ma ọ bụ ime tigbuo zọgbuo n’ebe ị nọ, si ebe ahụ pụọ. Anọkwala ìgwè mmadụ zukọtara ime ngagharị iwe nso

  • Luk 12:15​—Ya enwela mgbe ị ga-etinye ndụ gị n’ihe ize ndụ maka na ị chọghị ka a nara gị ihe ndị i nwere

Kpọnye VIDIO bụ́ Na-eme Ka Ndị Nwere Okwukwe, Ọ Bụghị Ndị Na-enweghị Okwukwe​—Na-eme Ka Ịnọk, Ọ Bụghị Lemek. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

Olee otú ihe Ịnọk mere si nyere nna ahụ anyị hụrụ na vidio a aka ime mkpebi ndị o mere ma mee ihe o mere n’oge e nwere tigbuo zọgbuo?​—Hib. 11:5

E nwere otú ihe ga-adị, Onye Kraịst achọọ ime ihe ụfọdụ kwesịrị ekwesị iji chebe onwe ya ma ọ bụ ihe ndị o nwere. Ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-eme ihe niile ọ ga-emeli ka ọ ghara igbu onye ọ bụla ma ọ bụ ka ikpe ọbara ghara ịma ya.​—Ọma 51:14; gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke gbara n’Ụlọ Nche Julaị 2017.

9. A Ga-ebido Ịkpọ Ndị Mmadụ Ka Ha Bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs na Satọdee, Mach 2

(Nkeji 5) Ọ bụ okenye ga-ekwu ya. Kwuo nhazi ọgbakọ unu mere maka ịkpọ ndị mmadụ òkù, maka okwu ihu ọha pụrụ iche, na Ncheta Ọnwụ Jizọs. Chetara ndị nkwusa na ha nwere ike ịhọrọ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa Mach na Eprel ma nye awa iri na ise.

10. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 40 na Ekpere