Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jenụwarị 15-21

JOB 36-37

Jenụwarị 15-21

Abụ nke 147 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Ihe Mere Ị Ga-eji Tụkwasị Nkwa Chineke Kwere na Anyị Ga-adị Ndụ Ebighị Ebi Obi

(Nkeji 10)

Jehova n’onwe ya na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi (Job 36:26; w15 10/1 13 ¶1-2)

Jehova nwere amamihe, nweekwa ike ọ ga-eji eme ka anyị dịrị ndụ na-aga (Job 36:27, 28; w20.05 22 ¶6)

Jehova na-akụziri anyị ihe anyị ga-eme ka anyị nweta ndụ ebighị ebi (Job 36:4, 22; Jọn 17:3)


Inwe okwukwe siri ike na Chineke ga-emezu nkwa o kwere inye anyị ndụ ebighị ebi na-enyere anyị aka ma nsogbu bịara anyị.​—Hib. 6:19; w22.10 28 ¶16.

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Job 36:26​—Ànyị kwesịrị inyewe onwe anyị nsogbu ma ọ bụrụ na o siiri anyị ike ịghọta na Jehova enweghị mmalite? Kọwaa. (w22.12 2 ¶4)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. (lmd isi nke 3 nọmba nke 3)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. (lmd isi nke 2 nọmba nke 5)

6. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere

(Nkeji 5) Okwu. ijwfq 57 ¶5-15​—Isiokwu: Gịnị Mere E Ji Kpagbuo Ndịàmà Jehova n’Oge Ndị Nazi Gbukpọrọ Ndị Mmadụ? (th ihe ọmụmụ nke 18)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 49

7. Jikere Maka Ihe Ndị Nwere Ike Ime Ka E Buga Gị Ụlọ Ọgwụ Ma Ọ Bụ Waa Gị Ahụ́

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ bụ okenye ga-eme ihe omume a.

Nzukọ Jehova ewepụtarala anyị ngwá ọrụ ndị na-enyere anyị aka irubere iwu Chineke nyere gbasara ọbara isi. (Ọrụ 15:28, 29) Ị̀ na-ekwe ka ha baara gị uru?

Kaadị DPA na Nke A Na-akpọ Identity Card (ic): Kaadị ndị a na-akọwa ihe mmadụ chọrọ ma a bịa n’okwu gbasara ọbara. Ndị nkwusa e mere baptizim nwere ike isi n’aka nwanna na-ahụ maka akwụkwọ n’ọgbakọ ha nweta kaadị DPA. Ha nwekwara ike isi n’aka ya nwetara ụmụ ha na-erubeghị afọ iri na asatọ kaadị nke a na-akpọ Identity Card (ic). Anyị kwesịrị ịna-eji kaadị ndị a mgbe niile. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka i dejupụta nke ọhụrụ, mee ya ozugbo.

Akwụkwọ A Na-akpọ Ihe Ụmụ Nwaanyị Dị Ime Kwesịrị Ịma (S-401) na Nke A Na-akpọ Ihe Ndị A Chọrọ Ịwa Ahụ́ na Ndị Na-arịa Ọrịa Kansa Kwesịrị Ịma (S-407): Akwụkwọ ndị a na-enyere anyị aka ịkwadebe nke ọma maka ịgwọ anyị ọrịa nakwa maka ihe ọ bụla gbasara ọbara. Gwa ndị okenye unu ka ha nye gị nke ọ bụla ị chọrọ n’akwụkwọ ndị a ma ọ bụrụ na ị dị ime, na a ga-awa gị ahụ́, ma ọ bụ na a ga-agwọ gị ọrịa kansa.

Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ: Ndị so na kọmitii a bụ ndị okenye a zụrụ ka ha nwee ike ịna-agwa ndị dọkịta na ndị nkwusa ihe ha kwesịrị ịma gbasara ọbara. Ha na onye na-agwọ gị nwere ike ikwurịta ụzọ ndị ọzọ e nwere ike isi gwọọ gị n’amịnyeghị gị ọbara. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, ha nwekwara ike inyere gị aka inweta dọkịta ga-ekweta ịgwọ gị n’amịnyeghị gị ọbara. Ụmụnna ndị a dị njikere inyere gị aka n’ụbọchị ọ bụla, ma n’ehihie ma n’abalị. Kpọtụrụ ha ozugbo ma ọ bụrụ na a ga-enye gị bed n’ụlọ ọgwụ, na a ga-awa gị ahụ́, ma ọ bụ na a ga-agwọ gị ọrịa kansa, ma ọ bụ ọrịa ndị yiri ya. Mee otú ahụ ọ bụrụgodị na i chere na ndị dọkịta agaghị ekwutewa okwu ọbara. I kwesịkwara ime otú ahụ ma ọ bụrụ na ị dị ime. Ị chọọ ka e nyere gị aka, gwa otu n’ime ndị okenye unu ka o nye gị nọmba ekwentị onye so na kọmitii a.

Kpọnye VIDIO bụ́ Olee Otú Kọmitii Ndị Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ Si Enyere Anyị Aka? Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

Olee otú Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ nwere ike isi nyere gị aka ma ọ bụrụ na a ga-agwọ gị ọrịa ma ọ bụ waa gị ahụ́?

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 67 na Ekpere