Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jenụwarị 22-28

JOB 38-39

Jenụwarị 22-28

Abụ nke 11 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Ị̀ Na-ewepụta Oge Ekiri Ihe Ndị E Kere Eke?

(Nkeji 10)

Mgbe Jehova kechara ụwa, o wepụtara oge leruo ihe ndị o kere anya (Jen. 1:10, 12; Job 38:5, 6; w21.08 9 ¶7)

Ndị mmụọ ozi wepụtara oge kirie ihe ndị Jehova kere (Job 38:7; w20.08 14 ¶2)

Anyị ga-atụkwasịkwu Jehova obi ma anyị na-ewepụta oge na-ekiri ihe ndị o kere ma na-aghọtakwu ha (Job 38:32-35; w23.03 17 ¶8)

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Job 38:8-10​—Gịnị ka amaokwu ndị a na-akụziri anyị banyere Jehova bụ́ Onye na-enye anyị iwu? (it-2 222)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 2) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Jiri obiọma kwụsị mkparịta ụka gị na onye ahụ mgbe ị ghọtara na ọ chọghị ikwu okwu. (lmd isi nke 2 nọmba nke 3)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 5) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Na mgbe mbụ gị na onye ahụ kparịtara, ọ sịrị gị na ọ dịbeghị anya mmadụ nwụnahụrụ ya. (lmd isi nke 9 nọmba nke 3)

6. Okwu

(Nkeji 5) lmd ihe ndị ọzọ a kọwara nke A nọmba nke 1​—Isiokwu: Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa Taa na Otú Ndị Mmadụ Si Akpa Àgwà Na-egosi na Ihe Ga-agbanwe n’Oge Na-adịghị Anya. (th ihe ọmụmụ nke 16)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 111

7. Ikiri Ihe Ndị E Kere Eke Na-enyere Anyị Aka Ịna-echeta Ihe Kacha Mkpa

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Mgbe ndị enyi atọ Job nakwa Setan nọ na-ekwu ihe na-abụghị eziokwu gbasara Job, ihe nọ na-echu Job ụra bụ ahụhụ ọ na-ata na nkatọ a na-akatọ ya.

Gụọ Job 37:14. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

Gịnị ka Job kwesịrị ime ka okwukwe ya sie ike otú o siri na mbụ?

Ọ bụrụ na ọnwụnwa emee ka ike gwụwa anyị, ikiri ihe ndị e kere eke ga-enyere anyị aka icheta otú Jehova si dị ukwuu, mee ka anyị kpebisie ike na anyị ga na-erubere ya isi, meekwa ka obi sie anyị ike na ọ ga-elekọtali anyị.​—Mat. 6:26.

Kpọnye VIDIO bụ́ Ihe Anyị Na-amụta n’Akwụkwọ Job​—Ụmụ Anụmanụ Chineke Kere. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

Olee otú vidio a si mee ka ị tụkwasịkwuo Jehova obi?

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) rr nkebi nke 2, isi nke 5 ¶1-8, vidio kọwara isiokwu a na-amụ

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 54 na Ekpere