Jenụwarị 29–Febụwarị 4
JOB 40-42
Abụ nke 124 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Ihe Anyị Na-amụta n’Ihe Mere Job
(Nkeji 10)
Cheta na ị marughị ihe ka Jehova (Job 42:1-3; w10 10/15 3-4 ¶4-6)
Dịrị njikere ịnabata ndụmọdụ Jehova na nzukọ ya na-enye gị (Job 42:5, 6; w17.06 25 ¶12)
Jehova na-agọzi ndị jidesiri ya aka ike n’agbanyeghị nsogbu (Job 42:10-12; Jems 5:11; w22.06 25 ¶17-18)
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
-
Job 42:7—Ònye n’eziokwu ka ndị enyi atọ Job nọ na-ekwujọ, oleekwa otú ịmara ihe a ga-esi enyere anyị aka idi mkparị? (it-2 808)
-
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Job 42:1-17 (th ihe ọmụmụ nke 11)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Onye nwe ụlọ abụghị onye chọọchị. (lmd isi nke 5 nọmba nke 3)
5. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
6. Okwu
(Nkeji 4) lmd ihe ndị ọzọ a kọwara nke A nọmba nke 2—Isiokwu: O Nweghị Ihe Ga-eme Ka E Bibie Ụwa A. (th ihe ọmụmụ nke 13)
Abụ nke 108
7. Nyere Ndị Ọzọ Aka Ka Ha Mata na Jehova Hụrụ Ha n’Anya
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Obi dị anyị ụtọ na anyị na-efe Chineke onye bụ́ ịhụnanya. (1 Jọn 4:8, 16) Ọmarịcha àgwà ndị Jehova nwere na-adọta anyị n’ebe ọ nọ, na-emekwa ka anyị na ya bụrụ nnu na mmanụ. Ebe anyị bụ atụrụ Jehova, anyị ma na ọ hụrụ anyị n’anya.
Anyị kwesịrị isi n’otú anyị si emeso ndị ezinụlọ anyị, ndị anyị na ha na-efe Jehova, na ndị ọzọ gosi ha ụdị ịhụnanya Jehova na-egosi anyị. (Job 6:14; 1 Jọn 4:11) Ọ bụrụ na anyị na-egosi ndị ọzọ na anyị hụrụ ha n’anya, anyị na-enyere ha aka ịmata onye Jehova bụ na ịbịaru ya nso. Ma, ọ bụrụ na anyị egosighị ndị ọzọ na anyị hụrụ ha n’anya, o nwere ike isiri ha ike ikweta na Jehova hụrụ ha n’anya.
Kpọnye VIDIO bụ́ Anyị Nwetara Ezinụlọ Hụrụ Anyị n’Anya nke Na-efe Jehova. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:
Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Lei Lei na Mimi gbasara otú igosi ndị ọzọ ịhụnanya dịruru ná mkpa?
Gịnị ka anyị ga-eme iji nyere ụmụnna anyị aka ka ha mata na Jehova hụrụ ha n’anya?
-
Were ha ka atụrụ Jehova hụrụ n’anya.—Ọma 100:3
-
Na-agwa ha okwu otú ga na-agba ha ume.—Efe. 4:29
-
Na-emeso ha ihe otú gosiri na ihe banyere ha na-emetụ gị n’obi. —Mat. 7:11, 12
8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) rr isi nke 5 ¶9-16