Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

January 8-14

JOB 34-35

January 8-14

Abụ nke 30 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Mgbe O Yiri Ka Ọ̀ Bụ Ndị Aka Ha Dị Ọcha Ka Ihe Ọjọọ Na-emekarị

(Nkeji 10)

Cheta na ọ bụghị Jehova na-akpata ihe ọjọọ ndị na-emenụ (Job 34:10; wp19.1 8 ¶2)

O nwere ike ịdị ka a naghị ata ndị ajọ omume ahụhụ ihe ọjọọ ha na-eme. Ma, e nweghị ebe ha ga-ezo Jehova aghara ịhụ ha (Job 34:21-26; w17.04 10 ¶5)

Ndị mmadụ na-ata ahụhụ n’ihi ihe ọjọọ ndị na-emenụ. Ụzọ kacha mma anyị ga-esi enyere ha aka bụ ịkụziri ha gbasara Jehova (Job 35:9, 10; Mat. 28:19, 20; w21.05 7 ¶19-20)

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Job 35:7​—Olee ihe Elaịhu bu n’obi mgbe ọ jụrụ Job, sị: “Gịnị ka [Chineke] na-enweta n’aka gị?” (w17.04 29 ¶3)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gosi ya otú anyị si amụrụ ndị mmadụ Baịbụl. (lmd isi nke 10 nọmba nke 3)

5. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Gosi onye nwere ụmụaka otú ọ ga-esi achọta ihe ga-enyere ndị mụrụ ụmụ aka na jw.org. (lmd isi nke 1 nọmba nke 4)

6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 58

7. Ọ̀ Na-amasị Gị ‘Ikwusa Okwu Chineke’ n’Oge Ị Na-anọghị n’Ozi?

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Pọl gbara Timoti ume, sị: “Kwusaa okwu Chineke. Jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ya.” (2 Tim. 4:2) Okwu Grik a sụgharịrị “jiri ịnụ ọkụ n’obi” nwekwara ike ịpụta “na-eme ya ngwa ngwa.” Mgbe ụfọdụ, ọ bụ ihe a na-agwa onye agha ma ọ bụ onye nche, bụ́ onye na-adị njikere mgbe niile n’ebe e kenyere ya ọrụ. Okwu a na-egosi na ọ na-amasị anyị ịdị njikere mgbe niile izi ndị mmadụ ozi ọma mgbe anyị na ha na-akparịta ụka.

Otú anyị si hụ Jehova n’anya na otú obi si dị anyị ụtọ maka ihe niile ọ na-emere anyị na-eme ka anyị na-akọrọ ndị ọzọ gbasara ọmarịcha àgwà ndị o nwere.

Gụọ Abụ Ọma 71:8. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

Olee ihe ndị dị mma ị ma gbasara Jehova ị ga-achọ ịkọrọ ndị ọzọ?

Ihe ọzọ na-eme ka ọ na-amasị anyị ịna-agba àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi bụ maka na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya.

Kpọnye VIDIO bụ́ Otú Ihe Karịrị Narị Mmadụ Abụọ Si Mụta Eziokwu. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  •   Olee otú izi ndị mmadụ ozi ọma n’oge a na-anọghị n’ozi si mee ka ihe karịrị narị mmadụ abụọ mụta eziokwu?

  •   Olee uru ndị ahụ nọbu n’otu chọọchị ritere n’eziokwu ha mụtara?

  • Olee otú ịhụ ndị mmadụ n’anya si eme ka anyị na-agba àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi?

  • Gịnị mere i ji chee na ịgba àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi bụ ụzọ dị ezigbo mma anyị si enyere ndị mmadụ aka ịmata Jehova?

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) rr isi nke 4 ¶1-9, vidio kọwara isiokwu a na-amụ, igbe 4A

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 138 na Ekpere