Ụmụnna nwaanyị ndị a ji Ozi Ọma Si n’Aka Chineke na-ezi ndị mmadụ ozi ọma na Madagaska

USORO IHE OMUME OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ Jenụwarị 2016

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Otú e nwere ike isi nye ndị mmadụ Ụlọ Nche, na Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! Jiri aro ndị a dee otú ọzọ ị ga-esi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Anyị Ga Na-arụsi Ọrụ Ike Ka Anyị Na-efe Chineke

Jiri anya nke uche hụ otú Hezekaya si gbaa mbọ ka a maliteghachi ife Chineke. Map na ihe ndị ọzọ e sere ebe a ga-enyere gị aka ịghọta 2 Ihe E Mere 29-30.

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

Otú Anyị Ga-esi Jiri Broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke Na-amụrụ Ndị Mmadụ Baịbụl

Ihe ise ga-eme ka ọ dịrị anyị mfe iji broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl nke ọma.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ịrụ na Ilekọta Ebe Ndị Anyị Na-anọ Efe Chineke Bụ Ihe Ọma Chineke Meere Anyị

Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị ji ife Chineke kpọrọ ihe ma a bịa n’ihe gbasara ilekọta ebe ndị anyị na-anọ efe ya?

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Jehova Na-agbaghara Onye Ji Obi Ya Niile Chegharịa

Nchegharị Manase chegharịrị rụpụtara ezigbo ihe. Jiri ihe ndị o mere tupu a kpụrụ ya tụnyere ihe ndị o mere mgbe ọ lọtara. (2 Ihe E Mere 33-36)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Jehova Na-emezu Nkwa Ya

Oge ihe ndị a kọrọ n’akwụkwọ Ezra 1-5, mere. N’agbanyeghị nsogbu ndị bịara ndị Juu, ha tachiri obi laghachi Jeruselem ma maliteghachi ife Chineke.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Jehova Chọrọ Ka Anyị Jiri Obi Anyị Niile Na-efe Ya

Ezra na ndị ọzọ na-alaghachi Jeruselem kwesịrị inwe okwukwe na obi ike. Map na ihe ndị ọzọ e sere ebe a ga-enyere gị aka ịhụ otú njem ha si gaa.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Kwadebe Obi Onye I Ziri Ozi Ọma Maka Mgbe Ị Ga-abịaghachi

Ihe atọ ga-eme ka ọ dịrị mmadụ mfe ịgaghachi na nke ndị o ziri ozi ọma.