Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Ihe I Nwere Ike Ikwu

ỤLỌ NCHE

Ajụjụ: Olee otú i chere ụwa a ga-adị ma mmadụ niile na-eme ihe a anyị ga-agụ na Baịbụl ugbu a?

Amaokwu Baịbụl: Hib. 13:18

Otú a ga-esi enye ya: Amaokwu Baịbụl a kwuru ka anyị na-akwụwa aka ọtọ n’ihe niile anyị na-eme. Ihe ọ pụtara bụ na anyị ga na-ekwu eziokwu mgbe niile. Ụlọ Nche a kwuru ihe ga-enyere anyị aka ịna-eme otú ahụ.

ỤLỌ NCHE (peeji nke 16)

Ajụjụ: O nwere otu ajụjụ dị n’Ụlọ Nche a m chọrọ igosi gị. [Gụpụta ajụjụ nke mbụ.] Ụfọdụ ndị na-ekwu na mmadụ nwụọ mkpụrụ obi ya agaa biri ebe ọzọ. Ndị ọzọ na-ekwukwa na mmadụ nwụọ nke ya agaa. Gịnị ka gịnwa chere?

Amaokwu Baịbụl: Ekli. 9:5

Otú a ga-esi enye ya: Isiokwu a ga-akọwakwuru gị gbasara ihe a Baịbụl kwuru. M ga-achọ ka ị gụọ ya. Anyị ga-elebakwu ya anya ma m bịa oge ọzọ.

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Otú a ga-esi enye ya: M bịara ka m gosi gị otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl. Akwụkwọ a ga-enyere gị aka ịmụta otú ị ga-esi jiri Baịbụl gị mata azịza ajụjụ ndị na-echu ọtụtụ ndị ụra taa.

Ajụjụ: Ịgụ Baịbụl ọ̀ na-amasị gị? Ka m jiri akwụkwọ a zi gị ihe gosiri na Baịbụl esighị ike nghọta. [Gị na ya mụọ ajụjụ nke 1 dị n’isiokwu nke 2.]

Amaokwu Baịbụl: Mkpu. 4:11

DEE OTÚ ỌZỌ Ị GA-ESI JIRI OTU N’IME AKWỤKWỌ NDỊ A ZIE OZI ỌMA

Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.