Jehova Na-emezu Nkwa Ya
Jehova kwere ndị ya nkwa na ha ga-amaliteghachi ife ya n’ụlọ nsọ dị́ na Jeruselem. Ma mgbe ha lọtara, e nwere ọtụtụ ihe nyetụrụ ha nsogbu, ya eyie ka ihe ahụ Jehova kwuru agaghị emezu. Otu n’ime ha bụ iwu eze nyere ka a kwụsị ịrụ mgbidi Jeruselem. Ọtụtụ ndị Juu chere na a gaghị arụchali mgbidi ahụ.
-
Ihe dị ka 537 T.O.N.K.
Saịrọs nyere iwu ka a rụghachi ụlọ nsọ
-
Ọnwa nke asaa
A rụrụ ebe ịchụàjà; a chụrụ àjà
-
536 T.O.N.K.
A tọrọ ntọala ụlọ nsọ
-
522 T.O.N.K.
Eze Atazaksis kwụsịrị ha ọrụ
-
520 T.O.N.K.
Zekaraya na Hagaị gbara ndị Juu ume ka ha maliteghachi ọrụ
-
515 T.O.N.K.
A rụchara ụlọ nsọ