OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-EMEKWU NKE ỌMA N’OZI ỌMA
Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma —Kwadebe Obi Onye I Ziri Ozi Ọma Maka Mgbe Ị Ga-abịaghachi
IHE MERE O JI DỊ MKPA:
Ọ bụrụ na anyị ezie ndị mmadụ ozi ọma, anyị na-achọ ịgaghachi kụzikwuoro ha gbasara Jehova. (1 Kọr. 3:6) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị achọpụta na onye anyị ziri ozi ọma nwere mmasị, anyị kwesịrị ịtọgbọrọ ya ajụjụ anyị ga-aza n’oge ọzọ. Ime otú a ga-eme ka ọ gụwa ya agụụ ka anyị bịaghachi, meekwa ka ọ dịrị anyị mfe ịma otú anyị ga-esi akwado tupu anyị agaghachi na nke ya. Anyị gaghachi, anyị asị ya na anyị bịara ka anyị zaa ajụjụ ahụ anyị hapụrụ n’oge gara aga.
IHE ANYỊ GA-EME:
-
Mgbe ị na-akwado otú ị ga-esi zie mmadụ ozi ọma, kwadoo ajụjụ ị ga-atọgbọrọ onye i ziri ozi ọma nke ị ga-aza ma ị gaghachi na nke ya. Azịza ajụjụ ahụ nwere ike ịdị n’akwụkwọ ị ga-achọ inye ya ma ọ bụkwanụ ya adịrị n’otu n’ime akwụkwọ ndị anyị ji amụrụ ndị mmadụ Baịbụl nke ị ga-eji malitere ya ọmụmụ Baịbụl ma ị gaghachi.
-
Ọ bụrụ na onye i ziri ozi ọma nwere mmasị, jụọ ya ajụjụ ahụ ị kwadoro ma gwa ya na ị ga-abịaghachi zaa ajụjụ ahụ. Gị na ya yiekwa oge na ebe ị ga-abịaghachi ka unu tụlee ya.
-
Gbalịa gaa mgbe gị na ya yiri.—Mat. 5:37.