Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | EZRA 6-10

Jehova Chọrọ Ka Anyị Jiri Obi Anyị Niile Na-efe Ya

Jehova Chọrọ Ka Anyị Jiri Obi Anyị Niile Na-efe Ya

Ezra kwadebere ịlaghachi Jeruselem

7:6, 22; 8:26, 27

  • Ezra natara Eze Atazaksis ikike ka ọ laa Jeruselem iji mee ka ndị Izrel maliteghachi ife Jehova n’ebe ahụ

  • Eze Atazaksis nyere Ezra “ihe niile ọ rịọrọ” ya maka ịrụzi ụlọ Jehova. Ihe ndị o nyere ya bụ: ọlaedo, ọlaọcha, ọka wit, mmanya, mmanụ, na nnu. A gbanwee ihe a niile n’ego, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ ijeri naịra iri abụọ

Ezra nwere obi ike na Jehova ga-echebe ndị ohu ya

7:13; 8:21-23

  • Ịlaghachi Jeruselem adịrịghị ha mfe

  • Isi Babịlọn rute Jeruselem fọrọ obere ka o ruo otu puku kilomita na narị isii. Ụzọ ha si lọta jọrọ njọ, ndị omekome na anụ ọjọọ jukwara ya

  • Ịlọrute Jeruselem wekwara ha ihe dị ka ọnwa anọ

  • Ndị ahụ na-alaghachi Jeruselem kwesịrị inwe okwukwe na obi ike, feekwa Jehova nke ọma

IHE NDỊ EZRA BU LAGHACHI BỤ:

Ọlaọcha na ọlaedo na-anyị ihe karịrị narị talent asaa na iri ise. Ihe dị ka arọ enyi atọ gbara agba

NSOGBU NDỊ HA NWERE MGBE HA NA-ALAGHACHI BỤ:

Ndị omekome, ụzọ ọjọọ, anụ ọjọọ