Jenụwarị 4- 10
2 IHE E MERE 29-32
Abụ nke 114 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Anyị Ga Na-arụsi Ọrụ Ike Ka Anyị Na-efe Chineke”: (Nkeji 10)
2 Ihe 29:10-17—Mbọ Hezekaya gbara mere ka ndị Juu maliteghachi ife Jehova
2 Ihe 30:5, 6, 10-12—Hezekaya kpọrọ ndị niile obi ha dị n’ife Jehova ka ha zukọta ọnụ fee Chineke
2 Ihe 32:25, 26—Hezekaya maliteghachiri ịdị umeala n’obi (w05 10/15 25 ¶20)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
2 Ihe 29:11—Olee ihe anyị mụtara n’otú Hezekaya si jiri ife Chineke kpọrọ ihe? (w13 11/15 17 ¶6-7)
2 Ihe 32:7, 8—Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme ugbu a iji kwadebe maka ọdịnihu? (w13 11/15 20 ¶17)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova?
Olee ihe ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a nke ị ga-eji zie ndị mmadụ ozi ọma?
Ọgụgụ Baịbụl: 2 Ihe 31:1-10 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Otú Anyị Ga-esi Zie Ndị Mmadụ Ozi Ọma n’Ọnwa A: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-ebu ụzọ kpọnye vidio nke mbụ na-egosi otú a ga-esi nye ndị mmadụ Ụlọ Nche. E kirichaa ya, a tụlee otú onye nkwusa e gosiri na ya si kwulite ihe ya na onye o ziri ozi ọma ga-atụle n’ụbọchị ọzọ. A ga-akpọnyekwa vidio nke abụọ maka Ụlọ Nche, kpọnyekwa nke Ozi Ọma Si n’Aka Chineke ma tụlee ha otú ahụ e si tụlee nke mbụ. Gwa ụmụnna gbasara isiokwu bụ́ “Otú Anyị Ga-esi Jiri Broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke Na-amụrụ Ndị Mmadụ Baịbụl.” Gbaakwa ha ume ka ha dee otú ọzọ ha nwere ike isi zie mmadụ ozi ọma.
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Ịrụ na Ilekọta Ebe Ndị Anyị Na-anọ Efe Chineke Bụ Ihe Ọma Chineke Meere Anyị”: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ụmụnna ka ha kwuo ihe ụfọdụ mere ha obi ụtọ mgbe ha so na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Gbaakwa nwanna na-ahụ maka ilekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze ajụjụ ọnụ. Ọ ga-ekwu otú o si arụ ọrụ ya.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: ia isi nke 6 ¶1-14 (Nkeji 30)
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 142 na Ekpere
Chetakwa na a ga-ebu ụzọ kpọnyere ọgbakọ abụ ọhụrụ a ka ha gee. Ya kpọchaa, gwa ụmụnna ka ha bụzie ya.