OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ịrụ na Ilekọta Ebe Ndị Anyị Na-anọ Efe Chineke Bụ Ihe Ọma Chineke Meere Anyị
Mgbe a chọrọ ịrụ ụlọ nsọ na Jeruselem, o nwere ọtụtụ ihe a ga-arụ ga-efu ego buru ibu. Ma, ụmụ Izrel ji obi ha niile kwado ọrụ ahụ. (1 Ihe 29:2-9; 2 Ihe 6:7, 8) Mgbe a rụchara ụlọ ahụ, otú ndị Izrel si na-elekọta ya gosiri ma hà ji ife Chineke kpọrọ ihe ka ọ̀ bụ na ha ejighị ya kpọrọ ihe. (2 Eze 22:3-6; 2 Ihe 28:24; 29:3) Ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ, idewe ha ọcha, na ilekọta ha na-ewe anyị ma oge ma ego. Iso na-arụ ụlọ ndị a bụ ihe ọma na-enweghị atụ Jehova meere anyị, o sokwa n’ozi dị nsọ anyị na-ejere ya.—Ọma 127:1; Mkpu. 7:15.
OTÚ ANYỊ GA-ESI NYE AKA BỤ:
-
Iso na-edebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha ma a gbasaa ọmụmụ ihe. Ọ bụrụgodị na e nwere ihe mere na ị gaghị eso ndị ọzọ dewe ya ọcha, gbalịa dewe ebe nke ị nọ ọcha.
-
Iso arụ ọrụ mgbe a na-edewe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha na mgbe a na-arụzi ihe ụfọdụ. Ọ bụrụ na a gbakọọ aka rụọ ya, ọrụ ga-adị mfe, obi ga-adịkwa onye ọ bụla ụtọ.—lv 92-93 ¶18.
-
Inye onyinye. A sịgodị na ihe anyị nyere dị obere, Jehova ga-anabata ya ma ọ bụrụhaala na o si anyị n’obi.—Mak 12:41-44.
-
Iso rụọ ebe anyị na-anọ efe Jehova ma ọ bụrụ na ọ ga-adịrị gị mfe, ya sọkwa ya bụrụ na ị maghị otú e si arụ ụlọ.