MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Otú Anyị Ga-esi Jiri Broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke Na-amụrụ Ndị Mmadụ Baịbụl
-
Buru ụzọ jụọ ajụjụ paragraf unu chọrọ ịtụle ka onye ahụ buru ya n’uche.
-
Gụzienụ paragraf ahụ.
-
Gụọnụ amaokwu Baịbụl e kwuru ka a gụọ, gị ajụọ ya ajụjụ ụfọdụ ga-eme ka o jiri ihe amaokwu ahụ kwuru zaa ajụjụ paragraf ahụ.
-
Ọ bụrụ na paragraf dị́ n’okpuru ajụjụ ahụ karịrị otu, meekwanụ ihe a e kwuru na nke abụọ na nke atọ. Ọ bụrụ na e nwere vidio dị na jw.org/ig gbasara ihe ahụ unu na-amụ, kpọnyere ya onye ahụ.
-
Jụghachi ya ajụjụ paragraf ahụ ka ị mata ma ọ̀ ghọtakwara ihe paragraf ahụ na-ekwu.