Jehova Na-elekọta Ndị Ya
Jehova na-enyeju anyị nri ime mmụọ afọ otú ahụ onye na-emesapụ aka na-emere onye ọbịa ya.
“Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-emere ndị niile oké oriri”
-
N’oge Baịbụl, ndị mmadụ irikọ nri ọnụ na-egosi na ha dị n’udo, bụrụkwa enyi
“Nke ihe mara abụba nke ụmị jupụtara na ya, nke ezigbo mmanya doro edo, nke a zara aza”
-
Nri mara abụba na ezigbo mmanya doro edo, nke a zara aza, pụtara nri ime mmụọ kacha mma Jehova na-enye anyị