A Zọpụtara Ndị Chineke n’Ihi Okwukwe Hezekaya
Senakerib, eze Asiria, zigara Rabshake ka ọ gaa Jeruselem gwa ndị Juu ka ha chịliere ha aka elu. Ndị Asiria gwara ndị Juu okwu dị iche iche ga-eme ka obi daa ha mbà ka ha chịliere ha aka elu.
-
Enweghị onye inye aka. Ijipt agaghị enyeliri unu aka.—Aịza. 36:6
-
Obi abụọ. Jehova agaghị alụrụ unu ọgụ n’ihi na unu akpasuola ya iwe.—Aịza. 36:7, 10
-
Iyi egwu. Ndị agha Asiria ka unu ike. Unu agaghị emerili ha.—Aịza. 36:8, 9
-
Uru ha ga-erite. Ndụ unu ga-aka mma ma unu chịliere ndị Asiria aka elu.—Aịza. 36:16, 17
Hezekaya nwere okwukwe siri ike n’ebe Jehova nọ
-
O mere ihe niile o nwere ike ime iji kwadebe maka ichebe Jeruselem ma ndị Asiria bịa nọchibido ha
-
Ọ rịọrọ Jehova ka ọ napụta ha, gwakwa ndị obodo ya ka ha mee otu ihe ahụ
-
Jehova zọpụtara ndị Juu n’ihi okwukwe ya mgbe o zitere otu mmụọ ozi ka o gbuo ndị agha Asiria dị 185,000 n’otu abalị