Ebe ndị nkwusa na-ezi ozi ọma n’ebe dị nso na Monrovia, Laịberịa

USORO IHE OMUME OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ Jenụwarị 2018

Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta

Ihe gị na mmadụ nwere ike ịkparịta gbasara uru Baịbụl bara taa.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

“Alaeze Eluigwe Eruwo Nso”

Jọn biri ndụ dị mfe, o ji ndụ ya niile na-ejeere Jehova ozi. Ibi ndụ dị mfe taa ga-eme ka anyị nwekwuo ohere anyị ga-eji jeere Chineke ozi.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Ihe Anyị Na-amụta n’Ozizi Elu Ugwu Jizọs

Gịnị ka mmadụ ịmara mkpa ime mmụọ ya pụtara? Olee otú m nwere ike isi na-amụchikwu okwu Chineke anya?

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Olee Otú Ị Ga-esi Buru Ụzọ Mee Ka Gị na Nwanne Gị Dị n’Udo?

Olee ihe Jizọs na-akụzi banyere otú adịm ná mma anyị na ụmụnna anyị si gbasa ofufe anyị na-efe Chineke?

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Burunụ Ụzọ Na-achọ Alaeze Ahụ

Olee ihe kacha mkpa anyị kwesịrị ikpe n’ekpere?

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Kwụsịnụ Ichegbu Onwe Unu

N’ozizi elu ugwu ahụ, gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha kwụsị ichegbu onwe ha?

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Jizọs Hụrụ Ndị Mmadụ n’Anya

Jizọs gosiri na o nwere ikike ịgwọ ọrịa mgbe ọ gwọrọ ndị mmadụ ọrịa ha. Ma, ihe kachanụ mere o ji gwọọ ndị mmadụ ọrịa bụ ịhụnanya na ọmịiko dị ukwuu o nwere n’ebe ha nọ.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Jizọs Gwara Ndị Mmadụ Okwu Gbara Ha Ume

Mgbe anyị mere baptizim, anyị kwetara ịnyara yok Jizọs ma ghọọ ndị na-eso ụzọ ya. Anyị kwetakwara ime ihe ndị ya na iso ụzọ ya so. Ọ bụ eziokwu na ọ naghị adịcha mfe, ma ime otú ahụ na-eme ka anyị nweta ume.