“Alaeze Eluigwe Eruwo Nso”
-
Uwe Jọn na ejiji ya na-eme ka mmadụ mata na o bighị ndụ okomoko, kama na o ji ndụ ya niile na-ejeere Jehova ozi
-
Ọrụ pụrụ iche Jọn rụrụ ka onye kwadebeere Jizọs ụzọ ka mkpa karịa ihe ndị ọ hapụrụ
Ibi ndụ dị mfe ga-eme ka anyị nwee ohere anyị ga-eji jekwuoro Jehova ozi, meekwa ka anyị na-enwe obi ụtọ. Anyị nwere ike ime ka ndụ anyị dịkwuo mfe ma anyị . . .
-
mata ihe ndị dị anyị mkpa n’eziokwu
-
ghara ịzụ ihe ọ bụla anyị hụrụ
-
depụta otú anyị ga-esi na-emefu ego
-
tụfuo ihe ndị na-adịghịzi anyị mkpa
-
kwụọ ụgwọ ndị anyị ji
-
selata aka n’ọrụ ego ndị na-ewekọrọ oge anyị
Olee ihe ndị ibi ndụ dị mfe ga-enye m ohere ime?