Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MATIU 6-7

Burunụ Ụzọ Na-achọ Alaeze Ahụ

Burunụ Ụzọ Na-achọ Alaeze Ahụ

N’Ekpere Onyenwe Anyị, Jizọs gosiri na ihe gbasara nzube Chineke na Alaeze ya kwesịrị ịbụ ihe kacha anyị mkpa.

6:9-13

  • Aha Chineke

    Alaeze Chineke

    Uche Chineke

  • Nri ụbọchị

    Mgbaghara mmehie

    Ịnapụta anyị n’ọnwụnwa

Ihe ndị ọzọ m nwere ike ikpe n’ekpere gbasara Alaeze Chineke bụ:

  • Ka ozi ọma Alaeze ahụ na-aga n’ihu

  • Ka mmụọ nsọ Chineke mee ka okwukwe ụmụnna anyị ndị a na-akpagbu sie ike

  • Ka Chineke gọzie mbọ ụmụnna anyị na-agba n’ọrụ ụlọ ụfọdụ nzukọ a na-arụ ma ọ bụ ozi ọma a na-ekwusa n’ebe dị iche iche

  • Ka amamihe na ike Chineke na-eduzi ndị na-edu ndú n’ọgbakọ

  • Ihe ndị ọzọ