OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Kwụsịnụ Ichegbu Onwe Unu
N’ozizi elu ugwu ahụ, Jizọs kwuru, sị: “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere mkpụrụ obi unu.” (Mat. 6:25) Ọ bụ eziokwu na ụmụ mmadụ na-ezughị okè bi n’ụwa Setan na-echegbukarị onwe ha mgbe ụfọdụ, Jizọs na-agwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara ichegbubiga onwe ha ókè. (Ọma 13:2) Gịnị mere o ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na nchekasị maka ihe ndị e ji ebi ndụ nwere ike ịdọpụ uche anyị, mee ka o siere anyị ike iburu ụzọ na-achọ Alaeze ahụ. (Mat. 6:33) Ihe ndị ọzọ Jizọs kwuziri ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ikwe ka ihe na-enweghị isi na ọdụ na-echegbu anyị.
-
Mat. 6:26—Gịnị ka anyị na-amụta n’otú Jehova si elekọta anụ ufe nke eluigwe? (w16.07 9-10 ¶11-13)
-
Mat. 6:27—Gịnị mere mmadụ ichegbubiga onwe ya ókè ji bụrụ igbu oge? (w05 11/1 22 ¶5)
-
Mat. 6:28-30—Gịnị ka anyị na-amụta n’otú Jehova si elekọta okooko lili dị n’ọhịa? (w16.07 10-11 ¶15-16)
-
Mat. 6:31, 32—Olee otú Ndị Kraịst si dị iche ná ndị mba ọzọ? (w16.07 11 ¶17)
Olee ihe ndị m chọrọ ịkwụsị ichegbu onwe m maka ha?