Jenụwarị 22-28
MATIU 8-9
Abụ nke 17 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Jizọs Hụrụ Ndị Mmadụ n’Anya”: (Nkeji 10)
Mat. 8:1-3—Jizọs nweere otu onye ekpenta ọmịiko pụrụ iche (nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara n’amaokwu ndị ahụ)
Mat. 9:9-13—Jizọs hụrụ ndị ọtụtụ ndị kpọrọ asị n’anya (nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara n’amaokwu ndị ahụ)
Mat. 9:35-38—Ịhụnanya Jizọs nwere n’ebe ndị mmadụ nọ kpaliri ya izi ozi ọma ma mgbe ike gwụrụ ya. Ọ rịọkwara Chineke ka o zitekwuo ndị ọrụ (nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara n’amaokwu ndị ahụ)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Mat. 8:8-10—Olee ihe anyị nwere ike ịmụta ná mkparịta ụka Jizọs na onyeisi ndị agha ahụ? (w02 8/15 13 ¶16)
Mat. 9:16, 17—Gịnị ka Jizọs ji ihe atụ abụọ ndị a na-akụziri anyị? (jy 70 ¶6)
Gịnị ka ọgụgụ Baịbụl nke izu a kụziiri gị gbasara Jehova?
Olee ihe ndị ọzọ ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Mat. 8:1-17
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Nletaghachi nke Abụọ: (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Buru ụzọ mee ihe dị n’ebe e dere “Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta.” Gwa onye ahụ ka ọ bịa ọmụmụ ihe.
Nletaghachi nke Atọ: (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Họrọ amaokwu Baịbụl ị chọrọ. Nye ya akwụkwọ e ji amụ Baịbụl.
Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 6 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) bhs 47 ¶18-19
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Obere vidio si na vidio bụ́ ‘N’ezie Chineke Mere Ya Onyenwe Anyị na Kraịst’—Nke Mbụ: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Unu gụchaa Matiu 9:18-25 ma lechaa vidio ahụ, jụọ ndị na-ege ntị ajụjụ ndị a:
Olee otú Jizọs si gosi na ihe banyere nwaanyị oruru ọbara ahụ na Jeirọs na-emetụ ya n’obi?
Olee otú amaokwu ndị a ga-esi nyere gị aka n’otú i si ele amụma ndị Baịbụl buru banyere ihe ndị ga-eme n’Alaeze Chineke anya?
Olee otú ụfọdụ anyị nwere ike isi ṅomie ịhụnanya Jizọs nwere n’ebe ndị mmadụ nọ?
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) jy isi nke 5
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 95 na Ekpere