Jizọs Hụrụ Ndị Mmadụ n’Anya
Matiu isi nke asatọ na nke itoolu kọrọ ihe ụfọdụ gbasara ozi Jizọs jere na Galili. Jizọs gosiri na o nwere ikike ịgwọ ọrịa mgbe ọ gwọrọ ndị mmadụ ọrịa ha. Ma, ihe kachanụ mere o ji gwọọ ndị mmadụ ọrịa bụ ịhụnanya na ọmịiko dị ukwuu o nwere n’ebe ha nọ.
-
Jizọs gwọrọ onye ekpenta.—Mat. 8:1-3
-
Jizọs gwọrọ onye na-ejere otu onyeisi agha ozi ọrịa.—Mat. 8:5-13
Ọ gwọrọ nne nwunye Pita.—Mat. 8:14, 15
Ọ chụpụrụ ndị mmụọ ọjọọ, gwọọkwa ndị niile ahụ́ na-adịghị mma.—Mat. 8:16, 17
-
Jizọs chụpụkwara ndị mmụọ ọjọọ na-akpa ezigbo ike, chụba ha n’ime ìgwè ézì.—Mat. 8:28-32
-
Jizọs gwọrọ otu nwoke ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ.—Mat. 9:1-8
Ọ gwọrọ otu nwaanyị metụrụ uwe ya aka, kpọlitekwa ada Jeirọs n’ọnwụ.—Mat. 9:18-26
Ọ gwọkwara ndị ìsì abụọ na otu onye ogbi.—Mat. 9:27-34
-
Jizọs jegharịrị n’obodo ukwu nakwa n’obodo nta na-agwọ ụdị ọrịa ọ bụla nakwa ụdị nsogbu ahụ́ ike ọ bụla.—Mat. 9:35, 36
Olee otú m ga-esi na-egosikwu ndị mụ na ha nọ ịhụnanya na ọmịiko?