Jenụwarị 29–Febụwarị 4
MATIU 10-11
Abụ nke 4 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Jizọs Gwara Ndị Mmadụ Okwu Gbara Ha Ume”: (Nkeji 10)
Mat. 10:29, 30—Otú Jizọs si mee ka obi sie anyị ike na Jehova nwere mmasị n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ na-agba ume (nwtsty ihe ndị e ji kọwaa amaokwu ndị ahụ)
Mat. 11:28—Ijere Jehova ozi na-eme ka anyị nweta ume (nwtsty ihe a kọwara n’amaokwu ahụ)
Mat. 11:29, 30—Irube isi n’ịchịisi Kraịst na iso ntụziaka ya na-emekwa ka anyị nweta ume (nwtsty ihe a kọwara n’amaokwu ndị ahụ)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Mat. 11:2, 3—Gịnị mere Jọn Onye Na-eme Baptizim ji jụọ ajụjụ a? (jy 96 ¶2-3)
Mat. 11:16-19—Olee ihe ndị anyị ga-amụta n’amaokwu ndị a? (jy 98 ¶1-2)
Gịnị ka ọgụgụ Baịbụl nke izu a kụziiri gị gbasara Jehova?
Olee ihe ndị ọzọ ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Mat. 11:1-19
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Nletaghachi nke Abụọ: (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Jiri ihe dị n’ebe e dere n’“Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta” mee ya.
Nletaghachi nke Atọ: (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Họrọ amaokwu Baịbụl ị chọrọ na ajụjụ ị ga-aza ya mgbe ọzọ.
Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 6 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) bhs 45-46 ¶15-16—Gwa onye ahụ ka ọ bịa ọmụmụ ihe.
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
E Mere Ka Ndị ‘Ibu Arọ Na-anyịgbu’ Nweta Ume: (Nkeji 15) Kpọnye vidio bụ́ E Mere Ka Ndị ‘Ibu Arọ Na-anyịgbu’ Nweta Ume. Unu lechaa ya, jụọ ụmụnna ajụjụ ndị a:
Olee ihe ndị mere n’oge na-adịchabeghị anya mere ka agbamume dị ụfọdụ ndị mkpa?
Olee otú Jehova na Jizọs si jiri nzukọ a na-agba anyị ume?
Olee otú Okwu Chineke sikwa na-agba anyị ume?
Oleekwa otú onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike isi gbaa ibe ya ume?
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) jy isi nke 6, na igbe dị na peeji nke 20
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 138 na Ekpere