Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MATIU 10-11

Jizọs Gwara Ndị Mmadụ Okwu Gbara Ha Ume

Jizọs Gwara Ndị Mmadụ Okwu Gbara Ha Ume

11:28-30

“Yok m adịghị egbu mgbu”

Ebe Jizọs bụ kapịnta, ọ maara otú e si arụ yok, marakwa na e nwere ike itinye ya ákwà ma ọ bụ akpụkpọ anụ ka ọ dị mfe obubu. Mgbe anyị mere baptizim, anyị kwetara ịnyara yok Jizọs ma ghọọ ndị na-eso ụzọ ya, kwetakwa ime ihe ndị ya na iso ụzọ ya so. Ọ bụ eziokwu na ọ naghị adịcha mfe, ma ime otú ahụ na-eme ka anyị nweta ume, meekwa ka Chineke gọzie anyị.

Olee ngọzi ndị i nwetarala kemgbe ị nyaara yok Jizọs?