OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Olee Otú Ị Ga-esi Buru Ụzọ Mee Ka Gị na Nwanne Gị Dị n’Udo?
Were ya na i bi na Galili n’oge ahụ Jizọs nọ n’ụwa, nakwa na ị nọzi na Jeruselem maka Ememme Ụlọ Ndò. Ebe niile na-ekwo ekwo n’ihi ndị si ebe dị iche iche bịa maka ememme ahụ. Ị chọrọ iji ewu ịkpụ bịa chụọrọ Jehova àjà. Gị akpụrụ ya si n’etiti ìgwè mmadụ juru n’ụzọ obodo ahụ gawa n’ụlọ nsọ. Mgbe i ruru, gị ahụ na ebe niile juru na ndị bịakwara ịchụ àjà nke ha. Mgbe oge ruru ka i nye onye nchụàjà ewu ahụ i ji bịa, gị echetazie na o nwere nwanne gị obi na-adịghị mma n’ebe ị nọ, nke o nwekwara ike ịbụ na ọ nọ n’etiti igwe mmadụ ahụ ma ọ bụkwanụ n’obodo ahụ. Jizọs kwuru ihe i kwesịrị ime. (Gụọ Matiu 5:24.) Olee otú ihe a Jizọs kwuru nwere ike isi nyere gị na nwanna gị aka ime udo? Katụ ihe n’aro nke i chere dị mma n’igbe ndị a dị n’okpuru.
I KWESỊRỊ . . .
-
ịga ka gị na nwanna gị mezie ma ọ bụrụ na i chere na i mejọrọ ya
-
ime ka ọ ghọta na ọ bụghị obere ihe ọ bụla ka o kwesịrị iwere iwe, meekwa ka ọ ghọta na yanwa mejọkwara
-
ige nwanna gị ntị nke ọma mgbe ọ na-ekwu okwu. Ọ bụrụgodị na ị ghọtachaghị otú i si mejọọ ya, si n’ala ala obi gị rịọ ya mgbaghara maka otú ihe i mere si wute ya
NWANNA GỊ KWESỊRỊ . . .
-
ịkọrọ ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ unu ihe merenụ iji mee ka ha dunyere ya úkwù
-
ịbara gị mba, chetaghachiri gị ihe ndị i mere ya ma chọọ ka i kweta na i mejọrọ ya
-
ịghọta na otú i si kata obi bịa rịọ ya gosiri na ị dị umeala n’obi, ya esizie n’ala ala obi ya gbaghara gị
Ọ bụ eziokwu na anyị anaghịzi eji ụmụ anụmanụ achụrụ Chineke àjà taa, ma, olee ihe Jizọs na-akụzi banyere otú adịm ná mma anyị na ụmụnna anyị si gbasa ofufe anyị na-efe Chineke?