Ihe Anyị Na-amụta n’Ozizi Elu Ugwu Jizọs
Ị̀ maara mkpa ime mmụọ gị?
N’asụsụ Grik, otú e si dee okwu ahụ bụ́ “ndị maara mkpa ime mmụọ ha” bụ “ndị na-arịọ arịrịọ maka mmụọ nsọ.” (Mat. 5:3) Ihe ndị anyị ga-eme iji gosi na anyị chọrọ ka Chineke na-eduzi anyị bụ . . .
-
ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị
-
ịna-akwado ọmụmụ ihe na ịna-agachi ọmụmụ ihe anya
-
ịna-agbalị na-agụ akwụkwọ anyị nakwa ihe ndị dị n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet
-
ịna-ele Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova nke ọnwa ọ bụla
Olee otú m nwere ike isi na-amụchikwu okwu Chineke anya?