Febụwarị 22-28
ỌNỤ ỌGỤGỤ 5-6
Abụ nke 81 na Ekpere
Okwu Mmeghe (1 nkeji)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Olee Otú Ị Ga-esi Na-eṅomi Ndị Naziraịt?”: (Nkeji 10)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 10)
Ọnụ Ọgụ. 6:6, 7—Olee otú o si bụrụ na Samsịn metụrụ ozu ndị o gburu aka ma ka bụrụ onye Naziraịt? (w05 1/15 30 ¶2)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova Chineke, ozi anyị, ma ọ bụ ihe ọzọ?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4) Ọnụ Ọgụ. 5:1-18 (th ihe ọmụmụ nke 10)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 3) Buru ụzọ mee ihe dị n’ebe e dere Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta. Gosi ya vidio bụ́ Olee Ndị Ka Ndịàmà Jehova Bụ? Mee ka ị̀ kpọnyeere ya vidio ahụ, unu emeekwa ozugbo ka ùnu elechaala ya. Kwurịtazienụ ihe dị na ya (th ihe ọmụmụ nke 1)
Nletaghachi: (Nkeji 4) Buru ụzọ mee ihe dị n’ebe e dere Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta. Nyezie ya otu n’ime akwụkwọ ndị anyị ji akụziri ndị mmadụ ihe. (th ihe ọmụmụ nke 3)
Okwu: (Nkeji 5) w06 1/15 32—Isiokwu: Ihe Dị Ịtụnanya A Chọpụtara nke Na-egosi na Ihe Baịbụl Kwuru Bụ Eziokwu. (th ihe ọmụmụ nke 13)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Ị̀ Ga-arụ Ọrụ Ọsụ Ụzọ Inyeaka n’Ọnwa Mach ma Ọ Bụ Eprel?”: (Nkeji 5) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
A Ga-ebido Ịkpọ Ndị Mmadụ Ka Ha Bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs na Satọdee, Febụwarị 27: (Nkeji 10) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Nye onye ọ bụla otu akwụkwọ ịkpọ òkù, kwurịtakwanụ ihe dị na ya. Kwuzie nhazi e mere maka ịrụzu ókèala unu. Kpọnye vidio gosiri otú a ga-esi kpọọ ndị mmadụ òkù. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a: Olee mgbe anyị kwesịrị igosi mmadụ vidio bụ́ Na-echeta Ọnwụ Jizọs? Olee ihe ụfọdụ nwere ike igosi na onye nwe ụlọ nwere mmasị?
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) bt isi nke 5 ¶9-16 na igbe dị na peeji nke 41 na 42
Okwu Mmechi (Nkeji 3)
Abụ nke 36 na Ekpere