Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ịhụnanya nke Kraịst nwere na-akpali anyị.”—2 Kọr. 5:14

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ị̀ Ga-arụ Ọrụ Ọsụ Ụzọ Inyeaka n’Ọnwa Mach ma Ọ Bụ Eprel?

Ị̀ Ga-arụ Ọrụ Ọsụ Ụzọ Inyeaka n’Ọnwa Mach ma Ọ Bụ Eprel?

Ị̀ ga-achọ imekwu ihe n’ozi Jehova n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs? (2 Kọr. 5:14, 15) N’ọnwa Mach na Eprel, ndị ọsụ ụzọ inyeaka nwere ike ịhọrọ inye awa iri atọ ma ọ bụ iri ise. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ịrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa ndị a, biko dejupụta fọm ya ma nye ya Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ unu. N’ọnwa ọ bụla, a ga-amara ọgbakọ ọkwa ndị a họpụtara ịsụ ụzọ inyeaka. Ihe a ga-eme ka ọgbakọ kwadoo ndị ahụ n’ozi ọma. Ka anyị niile jiri oge Ncheta Ọnwụ Jizọs mụtakwuo izi ozi ọma nke ọma ma gbarịta ibe anyị ume.—1 Tesa. 5:11.