Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

A Haziri Anyị Izi Mmadụ Niile Ozi Ọma

A Haziri Anyị Izi Mmadụ Niile Ozi Ọma

Jehova na-ahazikwa ndị ya taa ka ha na-eme uche ya otú ahụ ọ haziri ụmụ Izrel n’oge ochie. N’ụwa niile, alaka ụlọ ọrụ dị iche iche, sekit dị iche iche, ọgbakọ dị iche iche, na ìgwè ozi ubi dị iche iche na-agbakọ aka ọnụ akwado ọrụ ikwusa ozi ọma. Anyị na-ekwusara mmadụ niile ozi ọma, ma ndị anyị na ha na-anaghị asụ otu asụsụ.—Mkpu. 14:6, 7.

Ì chetụla echiche ịmụ asụsụ ọzọ ka i nwee ike iji ya nyere mmadụ aka ịmụta eziokwu Baịbụl? Ọ bụrụgodị na i nweghị oge ị ga-eji mụọ asụsụ ọzọ, i nwere ike iji JW Language app mụta otú ị ga-esi zie onye na-asụ asụsụ ọzọ ozi ọma ná nkenke. I jiri ya zichaa mmadụ ozi ọma, ị ga-enwe ụdị obi ụtọ ahụ Ndị Kraịst oge mbụ nwere mgbe o juru ndị si mba ọzọ anya n’ihi na ha na-anụ banyere “ihe ndị dị ebube nke Chineke” n’asụsụ ha.—Ọrụ 2:7-11.

LEENỤ VIDIO BỤ́ BỤRỤ ENYI JEHOVA—NA-EZI OZI ỌMA N’ASỤSỤ ỌZỌ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee mgbe JW Language app nwere ike inyere gị aka?

  • Olee ihe ụfọdụ dị na JW Language app?

  • Ndị na-asụ asụsụ niile kwesịrị ịnụ ozi ọma

    Olee asụsụ dị iche iche ndị nọ n’ókèala unu na-asụ?

  • Gịnị ka i kwesịrị ime ma onye na-asụ asụsụ ọzọ gosi na o nwere mmasị n’ozi ọma Alaeze Chineke?—od 100-101 ¶39-41