OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Chebe Alụmdi na Nwunye Gị
Jehova ejighị nkwa di na nwunye kwere ibe ha n’ụbọchị agbamakwụkwọ egwu egwu. O kwuru na di na nwunye ekwesịghị ịhapụ ibe ha. (Mat. 19:5, 6) E nwere ọtụtụ ndị Jehova alụmdi na nwunye ha na-aga nke ọma. Ma, e nweghị alụmdi na nwunye zuru okè. A ga-enwe nsogbu mgbe ụfọdụ. Ọtụtụ ndị chere na ọ bụrụ na di na nwunye na-esekarị okwu, ihe ga-ebi ya bụ ha ikewa ma ọ bụ ha ịgba alụkwaghịm. Anyị ekwesịghị inwe ụdị echiche a. Olee ihe ga-enyere ndị di na nwunye aka ka ha ghara itisa?
Lee ihe ise dị mkpa nwere ike inye aka.
-
Chebe obi gị. Otú ị ga-esi eme ya bụ izere ihe ndị dị ka ịchụ nwoke ma ọ bụ ịchụ nwaanyị na ntụrụndụ a na-eme ihe rụrụ arụ na ya. Ihe ndị a na-emebi alụmdi na nwunye.—Mat. 5:28; 2 Pita 2:14.
-
Mee ka gị na Chineke dịkwuo ná mma, na-agbalịsikwa ike ime ihe dị ya mma n’ezinụlọ gị.—Ọma 97:10.
-
Nọgide na-eyiri mmadụ ọhụrụ ahụ. Na-emekwara di gị ma ọ bụ nwunye gị ụmụ irighiri ihe ọma ndị ga-eme ka ihe dịtụrụ ya mfe.—Kọl. 3:8-10, 12-14.
-
Na-ekwurịtanụ okwu nke ọma, na-akwanyekwaranụ ibe unu ùgwù.—Kọl. 4:6.
-
Jirinụ ịhụnanya na-enye ibe unu ihe ruuru ya.—1 Kọr. 7:3, 4; 10:24.
Ọ bụrụ na di na nwunye ejiri alụmdi na nwunye ha kpọrọ ihe, ha na-akwanyere Jehova ùgwù bụ́ onye malitere alụmdi na nwunye.
LEENỤ VIDIO BỤ́ KA ANYỊ JIRI “NTACHI OBI NA-AGBA ỌSỌ”—NA-EDEBE IWU NDỊ NA-ACHỊKWA ỌSỌ AHỤ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
-
Ọ bụ eziokwu na alụmdi na nwunye nwere ike ibido nke ọma, ma olee nsogbu ndị nwere ike ịmalite?
-
Olee otú ihe Baịbụl kwuru nwere ike isi nyere ndị chere na ịhụnanya adịghị n’ezinụlọ ha aka?
-
Olee iwu ndị Jehova nyere gbasara alụmdi na nwunye?
-
Ọ bụrụ na di na nwunye chọrọ ka alụmdi na nwunye ha na-aga nke ọma, olee ihe ha abụọ kwesịrị ịna-eme?