Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Mgbakọ Ukwu Ndị Anyị Na-enwe Kwa Afọ Bụ Ohere Ọma Iji Gosi Ịhụnanya

Mgbakọ Ukwu Ndị Anyị Na-enwe Kwa Afọ Bụ Ohere Ọma Iji Gosi Ịhụnanya

Gịnị mere mgbakọ ukwu ndị anyị na-enwe kwa afọ ji atọgbu anyị atọgbu? Mgbakọ ndị a na-eme ka anyị nwee ohere iso ọtụtụ narị ụmụnna anyị ma ọ bụdị ọtụtụ puku ụmụnna anyị fekọọ Jehova ọnụ otú ahụ ụmụ Izrel mere n’oge ochie. Anyị na-eriju nri si n’Okwu Chineke afọ. Oge anyị na ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị ji anọrị na-atọkwa anyị ụtọ. Ihe ndị a na-eme ka ọ na-agụ anyị agụụ ịgazucha abalị atọ nke mgbakọ ndị ahụ.

Anyị gaa mgbakọ ndị a, anyị ekwesịghị ịna-eche naanị banyere uru ndị anyị ga-erite, kama, anyị kwesịkwara ịna-eche banyere otú anyị ga-esi gosi ndị ọzọ ịhụnanya. (Gal. 6:10; Hib. 10:24, 25) Anyị jide ụzọ aka ka ụmụnna anyị gafere ma ọ bụkwanụ chekwaa naanị oche ndị nke anyị chọrọ, ọ ga-egosi na anyị na-eche gbasara ndị ọzọ. (Fil. 2:3, 4) Oge mgbakọ na-abụ oge dị mma iji meta ndị enyi ọhụrụ. Tupu ihe omume amalite, n’oge nri ehihie, nakwa mgbe a gbasara, anyị nwere ike ịgbalị matakwuo ụmụnna ndị anyị na-amabughị. (2 Kọr. 6:13) Anyị na ndị anyị metara enyi ná mgbakọ ndị a nwere ike ịbụ enyi ruo ebighị ebi. Nke kachanụ bụ na ọ bụrụ na ndị mmadụ achọpụta otú anyị si hụ ibe anyị n’anya n’eziokwu, ha nwere ike ịbịa soro anyị fewe Jehova.—Jọn 13:35.

LEENỤ VIDIO BỤ́ MGBAKỌ MBA NIILE “ỊHỤNANYA ADỊGHỊ ADA ADA,” ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee otú ụmụnna anyị si gosi ụmụnna ndị si esi bịa mgbakọ mba niile nke afọ 2019 na ha hụrụ ha n’anya?

  • Gịnị mere ịdị n’otu ndị Jehova na ịhụnanya ha nwere ji pụọ iche?

  • Olee ụzọ dị iche iche ndị so n’Òtù Na-achị Isi kwuru na anyị nwere ike isi gosi ịhụnanya?

  • Olee otú ị ga-esi soro gosi ụmụnna gị na ị hụrụ ha n’anya ná mgbakọ?

    Olee otú ịhụnanya si mee ka ụmụnna anyị dị n’otu na Jamanị, nakwa na Saụt Koria?

  • Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?