Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ndị Nne na Nna Kụzierenụ Ụmụ Unu Ihe Ndị Ha Kwesịrị Ịma

Ndị Nne na Nna Kụzierenụ Ụmụ Unu Ihe Ndị Ha Kwesịrị Ịma

Anyị bi n’ụwa ọtụtụ ndị na-ewere ihe ọma ka ihe ọjọọ, na-ewerekwa ihe ọjọọ ka ihe ọma. (Aịza. 5:20) Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị na-eme ihe Jehova kpọrọ asị, ma nwoke na nwoke ibe ya na nwaanyị na nwaanyị ibe ya ime omume rụrụ arụ. Ụmụ akwụkwọ ma ọ bụ ndị ọzọ nwere ike ịchọ ịrata ụmụ anyị ka ha soro ha mewe omume rụrụ arụ. Olee otú unu ga-esi kwadebe ụmụ unu maka ụdị ihe a na ihe ndị ọzọ?

Kụzierenụ ụmụ unu iwu Jehova. (Lev. 18:3) Na-akụziri ha ihe Baịbụl kwuru banyere mmekọahụ. Ihe ị ga-akụziri ha ga-abụ ihe kwesịịrị afọ ole ha dị na ihe ha ga-aghọtali. (Diut. 6:7) Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ kụzierela ụmụ m ụzọ kwesịrị ekwesị e si egosi ịhụnanya, ihe mere anyị ji kwesị ịna-eyi uwe dị mma, na ihe mere ndị ọzọ ekwesịghị imetụ ha aka n’ebe na-ekwesịghị ekwesị? Ụmụ m hà ma ihe ha ga-eme ma mmadụ chọwa igosi ha ndị gba ọtọ ma ọ bụkwanụ chọwa ka ha mee ihe ọzọ Jehova kpọrọ asị?’ Ibu ụzọ mee ka ha mara ihe ndị a ga-enyere ha aka izere ọtụtụ nsogbu. (Ilu 27:12; Ekli. 7:12) Ị kụziere ụmụ gị ihe ndị i kwesịrị ịkụziri ha, ọ ga-egosi na ị hụrụ ihe nketa na-enweghị atụ Jehova nyere gị n’anya.—Ọma 127:3.

LEENỤ VIDIO BỤ́ WUO ỤLỌ NA-AGAGHỊ ADA ADA—CHEBE ỤMỤ GỊ KA ‘IHE ỌJỌỌ’ GHARA IME HA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Gịnị mere o ji esiri ụfọdụ ndị ike ịkụziri ụmụ ha banyere mmekọahụ?

  • Gịnị mere ndị nne na nna ji kwesị ịna-azụlite ụmụ ha “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova”?—Efe. 6:4

  • Amamihe bụ ihe nchebe

    Olee ihe ndị nzukọ Jehova wepụtarala iji nyere ndị nne na nna aka ịkụziri ụmụ ha gbasara mmekọahụ?—w19.05 12, igbe dị na peeji ahụ

  • Gịnị mere o ji dị mkpa ka gị na ụmụ gị na-ekwurịta okwu nke ọma tupu nsogbu abịa?