Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ihe Anyị Ga-amụta n’Aka Samuel

Ihe Anyị Ga-amụta n’Aka Samuel

Samuel rubeere Jehova isi ná ndụ ya niile. Mgbe ọ bụ nwata, o kweghị ebi ndụ ọjọọ ka ụmụ Ịlaị bụ́ Họfnaị na Finihas. (1 Sam. 2:​22-26) Jehova nọnyeere Samuel ka ọ na-eto. (1 Sam. 3:19) Mgbe o mere agadi, ọ nọkwa na-efe Jehova n’agbanyeghị na ụmụ ya emeghị otú ahụ.​—1 Sam. 8:​1-5.

Gịnị ka anyị ga-amụta n’aka Samuel? Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, obi sie gị ike na Jehova ma nsogbu ndị na-abịara gị nakwa otú obi na-adị gị. Ọ ga-enyere gị aka inwe obi ike. (Aịza. 41:​10, 13) Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna nwa ya kwụsịrị ife Jehova, ka akụkọ Samuel kasie gị obi. O nweghị otú Samuel gaara esi manye ụmụ ya torola eto ịnọgide na-efe Jehova. O nyefere Jehova ihe niiile n’aka ma nọgide na-erubere ya isi. O mere Jehova obi ụtọ. Otú i si erubere Jehova isi nwere ike ime ka nwa gị lọghachikwute Jehova.

LEENỤ VIDIO BỤ́ MỤTA IHE N’AKA HA​—SAMUEL, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee otú Samuel si gosi na o nwere obi ike mgbe ọ bụ nwata?

  • Olee otú Danny si gosi na o nwere obi ike?

  • Olee otú Samuel si mee ihe anyị kwesịrị iṅomi mgbe o mere agadi?

  • Jehova na-agọzi ndị nọgidere na-eme ihe ziri ezi

    Olee otú nne na nna Danny si mee ihe anyị kwesịrị iṅomi?