Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA | MEE KA OZI ỌMA NA-ATỌKWU GỊ ỤTỌ

Nyere Ndị Ị Na-amụrụ Baịbụl Aka Izere Mkpakọrịta Ọjọọ

Nyere Ndị Ị Na-amụrụ Baịbụl Aka Izere Mkpakọrịta Ọjọọ

Ka ndị anyị na-amụrụ Baịbụl nwee ike ịbụ enyi Jehova, ha kwesịrị inwe ndị enyi na-akpa àgwà ọma. (Ọma 15:​1, 4) Ụdị ndị enyi a ga-enyere ha aka ịna-akpa àgwà ọma.​—Ilu 13:20; lff isi nke 48.

Mgbe ị na-enyere ndị ị na-amụrụ Baịbụl aka izere mkpakọrịta ọjọọ, nweere ha ọmịiko. O nwere ike isiri ha ike ịhapụ ndị ha na ha na-akpa. N’ihi ya, gosi ha na i nwere mmasị n’ebe ha nọ, ma n’ụbọchị ndị gị na ha na-anaghị amụ ihe. I nwere ike izigara ha ozi n’ekwentị, kpọọ ha n’ekwentị, ma ọ bụ gaa leta ha. Ka ha na-emekwu nke ọma, i nwere ike ịkpọ ha ka ha soro ụmụnna nọrịa. Ime ihe ndị a ga-eme ka ha hụ na ha ga-enweta ihe karịrị ihe ha hapụrụ. (Mak 10:​29, 30) Gịnwa ga-enwekwa obi ụtọ ka ị na-ahụ ka ndị ọzọ na-abatakwu n’ọgbakọ Jehova.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NYERE NDỊ Ị NA-AMỤRỤ BAỊBỤL AKA IZERE MKPAKỌRỊTA ỌJỌỌ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Gịnị bụ mkpakọrịta ọjọọ?​—1 Kọr. 15:33

  • Olee otú Joy bu n’obi na nnọkọ Ndị Kraịst na-adị?

  • Olee otú Linda si nyere Joy aka inweta ezigbo ndị enyi o ji dochie ndị ha na ya na-akpabu?