Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ihe Ndị Jehova Kere Na-eme Ka Obi Sikwuo Anyị Ike na O Nwere Amamihe

Ihe Ndị Jehova Kere Na-eme Ka Obi Sikwuo Anyị Ike na O Nwere Amamihe

Jehova ọ̀ na-ama ihe ga-akacha abara anyị uru mgbe niile? Ehenụ. N’ihi ya, anyị ga-egosi na anyị ma ihe ma ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ọ bụla ọ sịrị anyị mee. (Ilu 16:​3, 9) Ma, o nwere ike isitụrụ anyị ike ma ọ bụrụ na ihe ọ sịrị anyị mee adabaghị n’ihe anyịnwa chọrọ ime. Ichebara ihe ndị Jehova kere echiche ga-eme ka obi sikwuo anyị ike na Jehova nwere amamihe.​—Ilu 30:​24, 25; Rom 1:20.

LEENỤ VIDIO BỤ́ È KERE YA EKE? OLEE OTÚ ỤMỤ AHỤHỤ SI ACHARA IBE HA N’ỤZỌ? ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee ihe ọtụtụ ụmụ ahụhụ na-emekarị kwa ụbọchị?

  • Olee otú ụmụ ahụhụ si achara ibe ha n’ụzọ?

  • Gịnị ka ndị mmadụ nwere ike ịmụta n’otú ụmụ ahụhụ si aga?

LEENỤ VIDIO BỤ́ È KERE YA EKE? OTÚ AṄỤ A NA-AKPỌ BUMBLEBEE SI EFE KA IKUKU GHARA IBUFU YA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee ihe na-esiri ndị mmadụ ike ma ha na-anya obere ụgbọelu?

  • Olee otú aṅụ a na-esi efe ka ikuku ghara ibufu ya?

  • Gịnị ka ndị mmadụ nwere ike ilere anya n’aṅụ a rụpụta otu ụbọchị?

Olee ihe ndị Jehova kere ị na-ahụ n’ebe i bi na-egosi na o nwere amamihe?