AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
Ihe Ga-agaziri Anyị ma Anyị Na-eme Ihe A Gwara Anyị Mee
Devid chọrọ ibughachite igbe ọgbụgba ndụ Chineke na Jeruselem (1 Ihe 13:3)
Ihe agazirighị Devid maka na o bughị igbe ọgbụgba ndụ ahụ otú Jehova kwuru ka e si na-ebu ya (1 Ihe 15:13; w03 5/1 10 ¶12)
Ihe gaziiri Devid mgbe ọ gbara mbọ mata otú Jehova chọrọ ka e si na-ebu igbe ahụ ma buo ya otú ahụ (1 Ihe 15:2; 16:11; w03 5/1 11 ¶13)
Obi na-atọ Jehova ụtọ maka na anyị bu ihe ọma n’obi na-eme ihe anyị chọrọ ime. Ma, ihe ga-eme ka ọ nabata ihe anyị na-eme bụ ma anyị na-eme ya otú o kwuru.—Diut. 30:16.