OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Kpebie Ihe Ndị Ị Ga-eme n’Oge Ncheta Ọnwụ Jizọs
Kwa afọ, ndị Jehova na-atụsi anya ike izukọta maka Ncheta Ọnwụ Jizọs. Izu ole na ole tupu e mee Ncheta Ọnwụ Jizọs, nakwa mgbe e mechara ya, anyị na-eji ohere ndị magburu onwe ha eto Jehova ma na-ekele ya maka na o nyere nwa ya iji gbapụta anyị. (Efe. 1:3, 7) Dị ka ihe atụ, anyị na-agbasi mbọ ike ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ụfọdụ na-ahazigharị ihe ndị ha na-eme ka ha nwee ike ịsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa Mach ma ọ bụ Eprel. Ha nwere ike inye awa iri atọ ma ọ bụ iri ise. Ị̀ ga-achọ ijikwu oge buru ibu kwusaa ozi ọma n’oge a ga-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs? Olee ihe ga-enyere gị aka ime ya?
Ọtụtụ mgbe, ihe anyị chọrọ ime na-agakwu nke ọma ma anyị buru ụzọ mee atụmatụ otú anyị ga-esi eme ya. (Ilu 21:5) Ebe ọ bụ na Ncheta Ọnwụ Jizọs eruola eruo, anyị kwesịrị ibido ugbu a mewe atụmatụ ihe ndị anyị ga-eme. Chee gbasara otú ị ga-esi jirikwuo oge buru ibu kwusaa ozi ọma n’oge ahụ, cheekwa gbasara ihe ị ga-eme ka i nwee ike imezu ihe i bu n’obi. Rịọzie Jehova ka ọ gọzie mbọ gị.—1 Jọn 5:14, 15.
Gbalịa chee ụzọ ụfọdụ ị ga-esi jirikwuo oge buru ibu kwusaa ozi ọma n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs.